1 Corinthians
1 Corinthians 6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
1 Corinthians 6 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe onye ọbụla nʼetiti unu nwere esemokwu megide ibe ya, unu ọ pụrụ i buru okwu ahụ gaa nʼụlọikpe ka ndị ajọ omume kpeere unu ikpe, karịa ịga ya nʼihu ndị nsọ? Ọ bụ na unu amabeghị na ọ bụ ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe? Ọ bụrụkwa na unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ pụtara na unu etozughị oke idozi okwu ntakịrị dapụtara nʼetiti unu? Ọ bụ na unu amataghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi okwu ụka dịkarịsịrị nta nke ndụ a? Ya mere, ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nʼetiti unu, unu ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị ibi ndụ ha na-akpọ nzukọ ihe efu ka ha kpee ya? Ana m ekwu nke a ime ka ihere mee unu. Ọ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nʼetiti unu, onye ga na-ekpe ikpe dị nʼetiti nwanna na ibe ya? Ma lee, nwanna na-akpọrọ nwanna ya aga ụlọ ikpe, ka ndị na-ekweghị ekwe kpee ha ikpe! Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu? Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime ịst. Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze ? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko, ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze . Na mbụ, ụfọdụ nʼime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye . Ọ bụkwa site nʼaha anyị ọs ịst na nʼime Mmụọ nke anyị ka a gụrụ unu ka ndị ezi omume. Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m. Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” ị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị. Chineke mere ka anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie. Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ ịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ ịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa! Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” Ma onye ọbụla e jikọtara ya na anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ. Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya. Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke . E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye otuto.
Every verse in 1 Corinthians 6
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.