1 Samuel 24:16
“Mgbe Devid kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu Devid nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa.”
1 Samuel 24:16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 16 of 22 in 1 Samuel chapter 24 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
1 Samuel 24 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe Sọl sitere nʼịlụso ndị agha lọta, a gwara ya sị, “Devid nọ nʼọzara En-.” Sọl chịịrị puku ndị agha atọ a zụrụ nke ọma site nʼ niile, pụọ ịchọ na ndị ikom ya nʼetiti ọgba nkume, na nʼakụkụ ụzọ dị warawara nke Ọhịa. Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ. Ndị ikom sịrị ya, “Ahaa ugbu a bụ oge gị! Taa bụ ụbọchị ahụ anyị kwuru okwu ya, mgbe ọ sịrị, ‘Aghaghị m inyefe gị onye iro gị nʼaka, ka i mee ya dịka o si masị gị.’ ” Ma ji nwayọọ gaa nso ebe Sọl nọ bipụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya. Emesịa, obi malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl. Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “Onyenwe anyị ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye anyị tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye anyị tere mmanụ ka ọ bụ.” Devid sitere nʼokwu ndị a o kwuru baara ndị so ya mba. O nyeghị ha ohere ibuso Sọl agha. Emesịa, Sọl hapụrụ ọgba nkume ahụ. Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala. Mgbe ahụ gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ? Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye anyị tere mmanụ.’ Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m. Ka anyị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka anyị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka. Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka. “Ma onye kwanụ ka eze na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị? Ka anyị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.” Mgbe kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa. Ọ sịrị , “Ị bụ ezi mmadụ karịa m, nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m. E, i gosila m oke obi ebere taa, nʼihi na mgbe anyị nyefere m nʼaka gị, ị gbughị m. Ebee ka onye ahụ nọ nʼụwa niile, nke pụrụ ịhapụ onye iro ya mgbe ọ mara nʼọnya ya? Ka anyị kwụghachi gị ezi ihe nʼihi obi ebere i gosiri m taa. Ugbu a, amatala m na ị ghaghị ịbụ eze, ị ga-achịkwa alaeze . Biko, ṅụọra m iyi nʼaha anyị na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.” Devid ṅụụrụ Sọl iyi. Emesịa, Sọl laghachiri nʼụlọ ya, ma na ndị ikom ya laghachiri nʼọgba nkume ha.
Every verse in 1 Samuel 24
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.