1 Samuel 6:11

“Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ e tinyere oke na oyiyi etuto ọlaedo ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka ha dọkwasịrị nʼelu ụgbọala ahụ.”

1 Samuel 6:11 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 11 of 21 in 1 Samuel chapter 6 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 Samuel 6 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Igbe ọgbụgba ndụ anyị ahụ nọrọ nʼobodo ndị ọnwa asaa. Emesịa, ndị kpọrọ ndị nchụaja ha na ndị na-ajụ mmụọ ase jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme banyere igbe ọgbụgba ndụ anyị? Gwa anyị otu anyị ga-esi zilaga ya nʼala ya.” Ndị ahụ zara sị, “Ọ bụrụ na unu ezighachi igbe ọgbụgba ndụ chi ndị , unu ezighachila ya nʼaka efu, kama jirinụ onyinye aja ikpe ọmụma zilaga ya. Unu mee nke a, ihe otiti ndị a ga-ala. Unu ga-amatakwa ihe mere o ji na-ata unu ahụhụ ndị a.” Ha jụrụ, “Olee ụdị onyinye aja ikpe ọmụma anyị ga-enye.” A gwara ha, “Dịka ọnụọgụgụ ndịisi obodo si dị ise, unu ga-eziga onyinye oyiyi etuto ise nke e jiri ọlaedo kpụọ na oyiyi oke ise nke e jikwa ọlaedo kpụọ, nʼihi na ọ bụ otu ụdị ihe otiti ahụ ka o ji tie unu na ndịisi obodo unu niile. Jiri ọlaedo kpụọ oyiyi etuto na oke ndị ahụ na-emebi ala unu, si otu a nye chi ndị nsọpụrụ. Ma eleghị anya ọ ga-ewezuga aka ike ya site nʼebe unu na chi unu dị iche iche na ala unu nọ. Gịnị mere unu ga-eji nyịchie obi unu dịka ndị na mere? Mgbe mesiri ha ike, ọ bụ na ha ahapụghị ndị ka ha laa? “Wuonụ ụgbọala ọhụrụ, werekwanụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide nʼụgbọ ahụ. Ehi ndị a ga-abụ ndị a na-ejibeghị kọọ ọrụ ubi mbụ. Mgbe unu kegidere ehi ndị a, chịrịnụ ụmụ ha chụba ha nʼebe a na-edebe ehi. Werenụ igbe ọgbụgba ndụ anyị tinye nʼụgbọala ahụ, tinyekwa ihe ọlaedo ndị ahụ unu na-enye ka ọ bụrụ aja ikpe ọmụma unu nʼime igbe nta unu ga-etinye nʼakụkụ ya. Zilaganụ ya nʼụzọ ọ ga-agbaso. Ma guzonụ na-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọ gafee oke ala anyị banye -, unu ga-amata na ọ bụ anyị mere ka ihe ọjọọ ndị a dakwasị anyị. Ma ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ bụrụ na ọ lọghachi, anyị ga-amata na ihe otiti a bụ naanị ihe ndaba nke dakwasịrị anyị, o sikwaghị nʼaka anyị.” Ha were dịka okwu ndị a si dị. Ha weere nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide ha nʼụgbọala ahụ, werekwa ụmụ ha kpọchie nʼọgba anụ. Igbe ọgbụgba ndụ anyị na igbe nta ahụ e tinyere oke na oyiyi etuto ọlaedo ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka ha dọkwasịrị nʼelu ụgbọala ahụ. Ehi ndị ahụ dọkpụrụ ụgbọ ahụ gawa nʼụzọ -. Ha na-ebekwa muuu mgbe ha na-aga. Ha sogidere ụzọ ahụ na-aga. Ha echigharịghị gaa aka nri maọbụ aka ekpe. Ndị eze ndị sogidekwara ha nʼazụ tutu rute nʼoke ala -. Nʼoge a, ndị - nọ nʼubi na-ewe ihe ubi nke ọka wiiti na ndagwurugwu ala ahụ. Mgbe ha lepụrụ anya hụ igbe ọgbụgba ndụ anyị, ọṅụ juru ha obi. Mgbe ụgbọala ahụ batara nʼubi nwoke a na-akpọ na -, ọ kwụsịrị nʼakụkụ otu nkume ukwu dị nʼebe ahụ. Ngwangwa, ndị nọ nʼebe ahụ gbuwasịrị osisi e ji mee ụgbọ ahụ, gbukwaa ehi abụọ ahụ, were ha chụọrọ anyị aja nsure ọkụ. Ndị ikom ị nọ nʼebe ahụ buliri igbe ọgbụgba ndụ anyị na igbe nta ahụ dị nʼakụkụ ya nke ọlaedo niile a kpụrụ akpụ dị nʼime ya, dọkwasị ha nʼelu nkume. Ndị - chụrụ ọtụtụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nye anyị nʼụbọchị ahụ. Mgbe ndị eze ise obodo ndị hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼọn nʼụbọchị ahụ. Onyinye etuto ọlaedo ise a kpụrụ akpụ nke ha nyere anyị dị ka aja ikpe ọmụma nʼihi ihe mere ha bụ maka obodo ndị ndị a, Ashdọd, , Ashkelọn, Gat na ọn. Ha wetakwara oke ọlaedo a dịka ọnụọgụgụ obodo ndị si dị, bụ nke ndịisi ise ahụ nwere, obodo ndị e wusiri ike, na obodo nta niile ha. Nkume ukwu ahụ ebe a dọkwasịrị igbe ọgbụgba ndụ anyị, bụ ihe akaebe nʼubi , onye - ruo taa. Ma anyị tigburu iri ndị ikom asaa nʼetiti ndị - nʼihi na ha nyobara anya nʼime igbe ọgbụgba ndụ anyị ahụ. Nʼihi ya ndị - ruru ụjụ nʼihi ndị ahụ niile anyị tigburu. Ndị - jụrụ sị, “Onye pụrụ iguzo nʼihu anyị, bụ a dị nsọ? Olee ebe anyị ga-ezigakwa igbe ọgbụgba ndụ a?” Ha zipụrụ ndị ozi ka ha gaa gwa ndị sị ha, “Ndị ezighachila igbe ọgbụgba ndụ anyị. Bịanụ buru ya gaa nʼobodo unu.”

Every verse in 1 Samuel 6

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00