2 Corinthians
2 Corinthians 10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
2 Corinthians 10 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ma mụ onwe m bụ Pọl, ji ịdị nwayọọ na obi umeala nke ịst na-arịọ unu. Mụ, onye na-adị umeala mgbe mụ na unu nọ nʼihu nʼihu, ma na-enwe mkwuwa okwu nʼebe unu nọ mgbe m na-anọghị nʼetiti unu. Arịọ m unu, ka m ghara inwe obi ike mgbe m bịarutere dịka o kwesiri nʼebe ụfọdụ ndị nọ, site na iguzogide ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya. Ọ bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu agha dịka usoro anụ ahụ si dị. Nʼihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke mmadụ nkịtị nke ụwa, kama ha nwere ike nke mmụọ ịla ebe niile e wusiri ike nʼiyi. Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼiyi, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata , na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru ịst. Anyị nọ na njikere ịta erubeghị isi niile ahụhụ, mgbe irube isi gị zuruoke. Unu na-ele anya nʼihe ndị dị unu nʼihu. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe doro anya nye onye ọbụla na ha bụ nke ịst, ha matakwa na onwe ha, na otu ahụ ha bụ nke ịst na anyị onwe anyị bụkwa nke ya. Ugbu a, ọ bụrụ na m anya isi banyere ikike ahụ anyị nyere m nʼebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji wedaa unu ala, ihere agaghị eme m nʼihi nke a. Achọghị ka ọ dịka m a ga-asị na m sitere nʼakwụkwọ ozi m na-emenye unu egwu. Nʼihi na ha na-asị, “Akwụkwọ ozi ya dị arọ dịkwa ike, ma na mmadụ, ma nʼọdịdị ya na mmadụ adịghị ike, okwu ọnụ ya bụkwa ihe na-abaghị uru.” Ma ana m eme ka ndị dị otu a ghọta na ihe anyị na-ekwu site nʼakwụkwọ ozi mgbe anyị na-anọghị nʼetiti unu, ka anyị ga-eme ma anyị nọrọ nʼetiti unu. Anyị enweghị anya ike ihazi ọnọdụ maọbụ were onwe anyị tụnyere ndị ụfọdụ na ndị ahụ nʼeto onwe ha. Ma mgbe ha na-eji onwe ha na-atụ onwe ha, werekwa onwe ha na-atụnyere onwe ha, ha adịghị ezipụta nghọta. Ma anyị onwe anyị, adịghị anya isi banyere ihe ọbụla anyị na-enweghị ike ime. Kama anyị ga-anya isi nʼoke ọrụ ahụ kenyere anyị, ka anyị rụrụte ọ bụladị ruo nʼebe unu nọ. Nʼihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nʼihe gbasara unu, nʼihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu oziọma gbasara ịst. Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ niile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nʼetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu ga na-eto eto mgbe niile, ka ọrụ ya nʼetiti unu bụrụ nke ga-eto eto. Nke a ga-eme ka anyị nwee ike zisaa oziọma ahụ na mba ndị ọzọ ndị dị nʼofe ala unu, ghara iji ọrụ arụrụ nʼebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ na-etu ọnụ. Ma, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime anyị.” Nʼihi na ọ bụghị onye ji aka ya bulie onwe ya elu ka a na-anabata, kama ọ bụ onye anyị jiri aka ya bulie.
Every verse in 2 Corinthians 10
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.