2 John
2 John 1
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
2 John 1 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara nwanyị ahụ onye họpụtara, na ụmụ ya akwụkwọ a, bụ ndị m hụrụ nʼanya nʼime eziokwu. Ọ bụghị naanị m kama ndị niile maara eziokwu ahụ. Nʼihi eziokwu ahụ nke dị nʼime anyị, nke ga-adịgidekwa nʼime anyị ruo mgbe ebighị ebi: Amara, na ebere, na udo nke sitere na na ọs ịst, bụ Ọkpara ahụ dịnyere anyị nʼeziokwu nʼịhụnanya. Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ na ụfọdụ ụmụ gị na-ebi ndụ ịgbaso eziokwu dịka ihe nyere anyị nʼiwu. Ma ugbu a, ezi nwanyị, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere gị kama nke ahụ e nyere anyị site na mmalite. Ana m arịọ ka anyị hụrịta ibe anyị nʼanya. Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya. Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na ọs ịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide ịst. Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju. Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi ịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị . Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere na Ọkpara ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa izi unu ihe ọzọ dị iche site nʼozizi a, unu akpọbatala ya nʼụlọ unu, maọbụ nabatakwa ya. Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya. Ọ bụ ezie na enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere unu, ma achọghị m iji akwụkwọ na inki dee ha. Kama, ana m ele anya ịbịa leta unu ka mụ na unu kwukọrịta okwu ihu nʼihu, ka e sikwa otu a mee ka ọṅụ anyị zuo oke. Ụmụ nwanne gị nwanyị, bụ onye a họpụtara, na-ekele unu.
Every verse in 2 John 1
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.