2 Kings 19:7
“Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ””
2 Kings 19:7 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 7 of 37 in 2 Kings chapter 19 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
2 Kings 19 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe eze , nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu anyị. O zipụrụ ịm onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ eze na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz. Ha sịrị ya, “Otu a ka sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, na ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya. Ma eleghị anya anyị gị, ga-anụ okwu ahụ niile nke bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa dị ndụ emo. Eleghị anya anyị gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.” Mgbe ndị ozi eze bịakwutere Aịzaya, ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Otu a ka anyị kwuru, Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m. Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ” Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo agha. Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na , eze , na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie ozi, sị, “Gwanụ , eze , Ekwela ka onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe nʼaka eze Asịrịa.’ Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị? Chi niile nke mba niile ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị , , Rezef na nke ndị , ndị nọ na ? Olee ebe eze ndị maọbụ eze nọ? Olee ebe eze obodo , Sefavaim, Hena na nọkwa?” Mgbe natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ anyị, gbasaa ya nʼihu anyị. Hezekaya kpere ekpere nye anyị, sị, “O, Onyenwe anyị, Chineke nke , onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị , naanị gị bụ na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa. Tọọ ntị gị nʼala, o anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu ndị ahụ zitere, nke o ji ekwulu dị ndụ. “Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala mba niile a dị iche iche na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu. Ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa. Ugbu a, Onyenwe anyị anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị anyị, naanị, bụ .” Mgbe ahụ Aịzaya nwa Emọz zigaara ozi sị, “Otu a ka anyị, Chineke sịrị, Anụla m ekpere i kpere banyere , eze Asịrịa. Nke a bụ okwu nke anyị kwuru megide ya: “ ‘Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ọn na-elelị gị anya, ma jirikwa gị na-eme ihe ọchị. Nwaada na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide Nsọ nke ? I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, “Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu ọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ niile ya, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile. Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼ takpọọ.” “ ‘Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya; ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume. Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi na ome na-epupụta epupụta nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite. “ ‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ marakwa ọpụpụ gị na mbata gị marakwa oke iwe gị megide m. Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’ “Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya: “Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi; kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu. Nʼihi na ọ bụ site na ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta; otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu ọn pụta. “Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a. “Ya mere, nke a bụ ihe anyị kwuru banyere eze Asịrịa, sị, “ ‘Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya. Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a. Otu a ka anyị kwubiri ya. Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi , bụ ohu m.’ ” Nʼabalị ahụ, mmụọ ozi anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile. Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo . Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ ọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ na were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala . Isahadon, bụ nwa ya nwoke, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Every verse in 2 Kings 19
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.