Acts

Acts 24

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Acts 24 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ụbọchị ise gasịrị, onyeisi nchụaja bụ na ụfọdụ ndị okenye ndị na lọya ha aha ya bụ ọs bịara. Ha dum pụtara ịgbagide Pọl ama nʼihu onye na-achị obodo. Mgbe a kpọbatara ya, Tatulọs pụtara guzo boo ya ebubo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka ị bụ. Nʼihi gị, mmadụ niile enwela udo ogologo mgbe. Ịdị nkọ nke uche gị emeela ka mgbanwe dị nʼobodo a. Anyị ji ekele nke jupụtara nʼọṅụ na-anabata ihe ndị a nke ọma, nʼebe niile na nʼụzọ niile, gị , onye a na-asọpụrụ. Achọghị m itufu oge gị. Ana m arịọ ka i were ndidi na obiọma nụrụ nkenke okwu anyị ji bịa. “Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ ndị . Ọ chọkwara imerụ ụlọnsọ anyị, ya mere anyị ji jide ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dịka omenaala anyị siri dị, ọchịagha , bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị. Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.” Ndị kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme. Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị. Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na ife ofufe. Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo. Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m. Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma. Ma enwere m olileanya nʼebe nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị. Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu na nʼihu mmadụ niile. “Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ aja. Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla. Ma enwere ụfọdụ ndị si ịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m. Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye. Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’ ” Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe onyeisi agha bịara.” O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Feliks na nwunye ya , bụ onye bịara, ọ kpọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu banyere inwe okwukwe nʼime ọs ịst. Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere . Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.” Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka. Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs ọs nọchiri anya . Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị , Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ.

Every verse in Acts 24

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00