Colossians
Colossians 4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Colossians 4 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Unu ndị nwe odibo, jirinụ ịkwụba aka ọtọ na ikpe ziri ezi na-emeso ndị ohu unu omume, ebe unu maara na unu onwe unu nwere onyenwe unu nʼeluigwe. Na-anọgidenụ nʼekpere, nọọkwanụ na nche na-enyekwanụ ekele. Na-echetakwanụ anyị nʼekpere, ka meghere anyị ụzọ ikwusa oziọma, ka anyị nwee ike kwusaa ihe omimi ịst, nke m ji maka ya nọrọ nʼụlọ mkpọrọ, ka m nwee ike kwuo ya ka o doo anya otu m kwesiri. Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma. Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma. Taịkikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesikwara ntụkwasị obi, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nʼọrụ anyị, ga-akọrọ unu ihe niile banyere m. Ana m ezitere unu ya, ka unu mara ihe banyere ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa obi unu ume. Ezi nwanna anyị nwoke bụ ọs, onye kwesiri ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nʼime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme nʼebe a. Arịstakọs, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ, na-ekele unu. Mak nwanne na-ekelekwa unu. (Onye unu natara ihe ntụziaka banyere ya, ọ bụrụ na ọ bịarute nʼebe unu nọ, unu nabata ya nke ọma.) Jisọs, onye a na-akpọkwa Jọstus, na-ekelekwa unu. Ọ bụ naanị ndị a bụ ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ alaeze nʼebe a. Ha na-eme nnọọ nke ọma, na-enye m obi ụtọ. Epafras, odibo ịst ọs na onye bụkwa otu onye nʼime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge niile ka ọ na-ekpe ekpere nʼihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike bụrụ ndị tozuru etozu na ndị kwesiri ike nʼọchịchọ niile nke . Ana m agbara ya akaebe na ọ rụsịrị ọrụ ike nʼihi unu na nʼihi ndị na ndị . Ezi enyi anyị , onye dibịa ukwu anyị na na-ekele unu. Keleerenụ m ụmụnna anyị bi na na nwanna anyị na chọọchị na-ezukọ nʼụlọ ya. Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ dị na . Gụọkwanụ nʼotu mgbe ahụ akwụkwọ nke si na bịa. Gwanụ ka ọ kpachapụ anya rụchaa ọrụ anyị nyere ya ịrụ. Eji m aka m dee ekele nke a mụ onwe m bụ Pọl. Unu echefula na m nọ nʼagbụ. Ka amara dịnyere unu.
Every verse in Colossians 4
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.