Deuteronomy

Deuteronomy 25

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Deuteronomy 25 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe esemokwu dị nʼetiti ndị mmadụ, ha ga-ebuga ikpe ha nʼụlọikpe ebe ndị ikpe ga-elenye anya nʼikpe ahụ, maa onye ajọ omume ikpe, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya. Ọ bụrụkwa na onye ikpe mara kwesiri ka apịa ya ụtarị, onye ọkaikpe ga-eme ka onye ahụ dinaa ala nʼihu ya, ka apịakwa ya ọnụọgụgụ ụtarị kwesiri ajọ omume ya, ma agaghị eti ya karịa ọnụ ụtarị iri anọ. Ọ bụrụ na e tie onye ahụ ikpe mara ọnụ ụtarị karịrị nke a, ọ ga-abụ onye e leliri anya nʼihu ndị ibe ya. Mgbe ehi na-azọcha ọka, ejila ihe kechie ya ọnụ. Ọ bụrụ na nwoke anwụọ na-amụtaghị nwa, nwunye ya ahụ agaghị alụ di nʼama, kama nwanne nwoke di ya ga-alụrụ ya, ha ga-edinakọkwa. Nwa nwoke mbụ nwanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka a ghara ihichapụ aha ya nʼala . Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ ajụ ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwanyị ahụ ga-ejekwuru ndị okenye obodo ahụ nʼọnụ ụzọ ama, gwa ha sị, “Nwanne di m ajụla ime ka aha nwanne ya nwoke dịgide nʼ. O kweghị ịrụ ọrụ kwesiri nwanne di nʼebe m nọ.” Ndị okenye obodo ga-akpọ ya, dụọ ya ọdụ. Ọ bụrụ na ọ nọgide jụ sị, “Achọghị m ịlụ ya,” nwanyị ahụ ga-ejekwuru ya nʼihu ndị okenye, tọpụ akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ aka nri ya, bụọ ya asụ nʼihu, sị ya, “Otu a ka a na-eme nwoke ọbụla jụrụ iwuli ụlọ nwanne ya nwoke.” A ga-ama ahịrị ya nʼ dịka, “Ezinaụlọ nwoke ahụ e sitere nʼụkwụ ya yipụ akpụkpọụkwụ ya.” Mgbe ndị ikom abụọ na-alụ ọgụ, ọ bụrụ na nwunye otu nʼime ha abịa ịnapụta di ya site nʼaka onye na-eti ya ihe, ma nwanyị ahụ esetipụ aka jide nwoke ahụ nʼamụ ya, a ga-egbupụ aka nwanyị ahụ. Ebere adịghị ya. Enwela ụzọ ihe ọtụtụ abụọ nʼime akpa gị, nke dị arọ, na nke na-adịghị arọ. Enwela ụdị ihe ọtụtụ abụọ nʼụlọ gị, nke ukwu na nke nta. Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ anyị gị na-enye gị. Nʼihi na anyị gị kpọrọ onye ọbụla na-eme ihe ndị a asị, bụ onye ọbụla na-aghọ aghụghọ. Cheta ihe ndị mere gị nʼụzọ mgbe i si nʼ na-apụta. Chetakwa na ha lụsoro gị ọgụ mgbe ike gwụrụ gị, mgbe ị dara mba, tigbuo ndị niile ji nwayọọ na-abịa nʼazụ. Ha atụkwaghị egwu . Mgbe anyị gị mere ka i nwere onwe gị site nʼaka ndị iro gbara gị gburugburu, mgbe o mere ka i zuru ike nʼala ahụ anyị gị na-enye gị dịka ihe nketa, ime ka i nweta ya, ị ghaghị igbuchapụ ndị , ka ha bụrụ ndị a na-agaghị echetakwa ọzọ nʼokpuru eluigwe. Echefukwala ime otu a.

Every verse in Deuteronomy 25

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00