Deuteronomy
Deuteronomy 8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Deuteronomy 8 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Lezie anya hụ na i debezuru iwu ndị a niile m nyere gị taa. Ọ bụrụ na i debe ha, ọ bụghị naanị na ị ga-adị ndụ, kama ị ga-amụba, banyekwa inweta ala ahụ anyị kwere nna nna gị ha na nkwa. Chetakwa otu anyị bụ gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya. E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ anyị pụta. Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza. Nʼihi ya, mata nke a nʼobi gị, na dịka nna si adọ nwa ya aka na ntị, otu a ka anyị bụ gị si adọ gị aka na ntị. Debe iwu anyị gị. Na-ejegharị ije nʼụzọ ya, ma na-atụkwa ya egwu. Nʼihi na anyị gị na-ewebata gị nʼala mara mma, bụ ala nwere iyi, na ọdọ mmiri, ala nwere mmiri nke si nʼime ya na-asọpụta asọgharị nʼugwu na ndagwurugwu, ọ bụ ala na-epu ọka wiiti na ọka balị, na osisi vaịnị, na osisi fiig, na osisi pomegranet, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ. Ọ bụkwa ala jupụtara nʼihe oriri, ebe a na-agaghị enwe ụkọ nri. Ọ bụ ala ebe igwe jupụtara nʼime ya dị ka ha bụ nkume, ala ebe ọla jupụtakwara nʼugwu ya niile. Mgbe i riri rijuo afọ, too anyị gị nʼihi ala mara mma nke o nyere gị. Ma lezie anya ka ị ghara ichefu anyị gị, na-edebeghị iwu ya niile, na ikpe ya niile, na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa. Ka ọ ghara ị bụ, mgbe i riri rijuru afọ, mgbe i wuuru onwe gị ezi ụlọ dị mma birikwa nʼime ha, mgbe igwe ehi na igwe atụrụ gị mụbara, mgbe ọlaọcha na ọlaedo gị mụbara, na mgbe ihe niile i nwere mụbara. Kpachara anya hụ na nganga abanyeghị gị nʼobi, ime ka i chefuo anyị gị onye mere ka ị site nʼ, sitekwa nʼala ịbụ ohu pụta. Onye duuru gị nʼime ọzara ukwu ahụ dị egwu, ebe agwọ ọjọọ na akpị jupụtara, ebe na-ekpo ọkụ, nke mmiri na-adịghị. O sitere na nkume nye gị mmiri ọṅụṅụ O ji mánà nyejuo gị afọ nʼọzara, mánà ahụ nna gị ha na-amaghị ihe ọ bụ na mbụ. O mere ya nʼihi iweda mmụọ gị ala, na ịnwale gị, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma. I nwere ike kwuo sị, “Ọ bụ site nʼike aka m ka m ji baa ụba.” Ma cheta anyị gị, nʼihi na ọ bụ ya onwe ya na-enye gị ike i ji akpata akụ, ime ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike, bụ nke ọ ṅụrụ nna nna gị ha nʼiyi, dịka ọ dị taa. Ma ọ bụrụ na i chefuo anyị bụ gị, gbasoo chi ndị ọzọ, fee ha ofufe ma kpọọkwa isiala nye ha, ana m agba ama megide gị taa na ị ghaghị ịla nʼiyi. Ọ bụrụ na unu egeghị ntị nʼolu anyị unu, ime ihe ọ chọrọ, ọ ga-ala unu nʼiyi, dịka o si bibie mba ndị a niile dị iche iche ọ na-ebibi nʼihi unu.
Every verse in Deuteronomy 8
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.