Exodus
Exodus 8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Exodus 8 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara sị, “Jekwuru gwa ya, ‘Nke a bụ ihe anyị kwuru. Hapụ ndị m, ka ha gaa fee m ofufe. Ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ha ka ha gaa, aga m eme ka awọ jupụta nʼala niile. Osimiri Naịl ga-ejupụta nʼawọ. Ha ga-abata nʼụlọeze gị na nʼime ọnụụlọ ndina gị, ma nʼelu ihe ndina gị, ma nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, ma nʼụlọ ndị gị niile, na nʼebe a na-esi nri, ma nʼime ihe e ji agwakọta ụtụ ọka. Awọ ndị a ga-arịgokwa nʼahụ gị, na nʼahụ ndị gị, na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi.’ ” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara sị, “Gwa Erọn, ‘Setịpụ aka gị ya na mkpanaka gị nʼelu osimiri niile, na mmiri nta na ọdọ mmiri ndị , mee ka awọ jupụta ala niile.’ ” Erọn setịpụrụ aka nʼelu mmiri niile nke , awọ pụtara kpuchie ala ahụ niile. Ma ndị majiki jikwa ihe nzuzo ha mee ihe ahụ na Erọn mere. Ha mekwara ka awọ jupụta ala ahụ niile. Fero kpọrọ na Erọn rịọọ ha sị, “Rịọọnụ anyị ka o wepụrụ mụ na ndị m awọ ndị a. Emesịa aga m ekwe ka ndị gị gaa chụọrọ anyị aja.” Mosis zaghachiri sị, “Gị ka ọ dịrị ịgwa m mgbe m ga-arịọ arịrịọ a nʼisi gị na nʼisi ndị gị, ka e wezuga awọ ndị a site nʼụlọ unu, ma hapụ naanị ndị nọ nʼosimiri Naịl.” Mgbe ahụ sịrị , “Achọrọ m ka i mee ya echi.” zaghachiri sị, “Ọ dị mma, ka ọ dịrị dịka i kwuru. Mgbe ahụ, ị ga-amata na o nweghị onye dịka anyị anyị. Awọ ndị a niile ga-apụ site nʼebe ị nọ, na site nʼụlọ gị na site nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi na site nʼụlọ ndị niile. Ọ bụ naanị nʼosimiri Naịl ka ha ga-anọ.” Mgbe na Erọn sitere nʼụlọ pụọ, Mosis kpọkuru anyị ka o wepụ awọ ndị a o mere ka ha bịakwasị . Onyenwe anyị mere ihe rịọrọ. Awọ ndị ahụ niile nwụrụ nʼime ụlọ, na nʼama, na nʼọhịa. E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu. Ma mgbe hụrụ na awọ ndị a anwụchaala, o mechiri obi ya jụ ige na Erọn ntị, dịka anyị kwuru na ọ ga-eme. Ya mere, Onyenwe anyị gwara sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.” Mosis na Erọn mere nke a. Mgbe Erọn setịpụrụ aka tie mkpanaka ya nʼelu ala, anwụ nta jupụtara nʼala niile, nʼahụ ndị mmadụ, na nʼahụ anụmanụ ha. Ndanda ndị a jupụtakwara nʼuzuzu niile dị nʼala ahụ. Ndị na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile. Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara bụ, “Nke a bụ akaọrụ .” Ma mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka anyị kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị gwara sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru . Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe anyị kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe. Ọ bụrụ na ị chọghị ime otu a, aga m eme ka igwe ijiji jupụta nʼala niile. Ha ga-ejupụta gị nʼahụ na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi, na nʼahụ ndị gị niile, na nʼime ụlọ unu niile. “ ‘Nʼụbọchị ahụ, igwe ijiji ndị a agaghị emetụ ndị nọ na ebe ndị m bi. Mgbe ahụ ka ị ga-amata na mụ bụ anyị bịara ije nʼala a. Aga m emekwa ka ọ pụta ìhè na o nwere ihe dị iche nʼetiti ndị m na ndị gị. Ihe ịrịbama a ga-emezukwa echi.’ ” Nʼechi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe ijiji dị egwu nʼọnụọgụgụ bịara nʼala , jupụta nʼụlọ , na nʼụlọ ndị niile na-ejere ya ozi, na nʼala niile. E mere ka ala bụrụ ihe e ji ijiji mebie. Mgbe ihe ndị a na-eme, Fero kpọrọ na Erọn gwa ha okwu sị, “Gaanụ chụọrọ unu aja, ma ka ọ bụrụ nʼala .” Mosis zaghachiri sị, “Nke ahụ abụghị ihe ziri ezi, nʼihi na aja anyị na-aga ịchụrụ anyị anyị bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ndị . Ọ bụrụ na anyị achụọ aja a nʼihu ha, ha ga-eji nkume tugbuo anyị. Anyị ga-aga njem ụbọchị atọ nʼime ọzara gaa chụọrọ anyị anyị aja, dịka o nyere anyị iwu ka anyị mee.” Fero zaghachiri ha sị, “Aga m ekwenye ka unu ga chụọrọ anyị unu aja nʼọzara, ma unu agaghị aga ebe dị anya. Ugbu a, kperenụ m ekpere.” Mosis zara sị ya, “Ngwangwa m si nʼihu gị pụọ, aga m arịọ anyị arịrịọ. Echi, a ga-esite nʼụlọ , na nʼụlọ ndị na-ejere ya ozi, na nʼụlọ ndị niile wezuga ijiji ndị a. Ọ ga-adị mkpa na ga-elezi anya hapụ ịghọ aghụghọ ọzọ site ịjụ ka ụmụ gaa chụọrọ anyị aja.” Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu pụọ rịọọ anyị ka o mee ka ijiji ndị a gabiga. Onyenwe anyị mere dịka rịọrọ. Ijiji ndị a sitere nʼụlọ na ụlọ ndị na-ejere ya ozi na ụlọ ndị niile pụọ. O nwekwaghị ijiji ọ bụla fọdụrụ nʼala ahụ. Ma nʼoge a, Fero gara nʼihu ime ka obi ya sie ike. O kweghị ka ụmụ laa.
Every verse in Exodus 8
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.