Galatians
Galatians 1
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Galatians 1 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Pọl, onyeozi, na-abụghị site na nhọpụta nke mmadụ maọbụ site nʼike nke mmadụ, kama ọ bụ site nʼaka ọs ịst na , onye mere ka ọ site nʼọnwụ bilie. Ndị ụmụnna niile ndị mụ na ha nọ nʼebe a, Na-edegara nzukọ niile dị na ịa. Ka amara na udo nke sitere na anyị, na anyị ọs ịst dịrị unu. Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube bụ anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya. Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. O juru m anya, na unu esitela nʼebe onye ahụ kpọrọ unu site nʼamara ịst wezuga onwe unu, na-agbaso oziọma ọzọ, nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke ịst. A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ. Dị ka anyị buru ụzọ kwuo ya na mbụ, ka m kwuokwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-ekwusara unu oziọma dị iche na nke ahụ unu nabatara, ka onye ahụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu ịst. Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya. Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ ọs ịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m. Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị , na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya. Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị . Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha. Ma mgbe ọ tọrọ ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya, ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya. Ejekwaghị m ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m ịa, ma laghachikwa azụ na ọs. Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara ịhụ . Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise. Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị , nwanne anyị. Ana m agwa unu okwu a nʼihu . Ihe ndị a m na-ekwu abụghị okwu ụgha. Emesịa, agara m na . Ma ndị ịst nọ na chọọchị niile dị nʼala ịa amaghị onye m bụ. Naanị ihe ha na-ekwu bụ, “Onye ahụ na-esogbu anyị na mbụ na-ekwusazi ugbu a okwukwe ahụ ọ gbalịsịrị ike ibibi na mbụ.” Ha nyere otuto nʼihi m.
Every verse in Galatians 1
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.