Isaiah
Isaiah 36
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Isaiah 36 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze , Senakerib, bụ eze Asịrịa, busoro obodo niile e wusiri ike agha, meriekwa ha. Mgbe ahụ, eze Asịrịa sitere na zipụ ọchịagha ya, ya na usuu ndị agha ijekwuru na . Mgbe ọchịagha ahụ kwụsịrị nʼụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị , nʼụzọ jere nʼebe ọhịa Ọsụ akwa. Eliakịm, nwa , onye nlekọta ụlọeze, na , bụ ode akwụkwọ eze, na nwa , onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ya. Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ : “ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa, na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere? Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi, mere i ji enupu isi nʼokpuru m? Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼ, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka , eze dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi. Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị anyị bụ anyị obi.” Ọ bụghị ya ka wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị na , “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja a?” “ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha. Ị ga-esi kwa aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼ maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya? Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma ọ bụghị nkwado anyị? Onyenwe anyị ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’ ” Mgbe ahụ ịm, Shebna na sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ , ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ , ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.” Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?” Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ , sị, “Nụrụnụ okwu niile nke eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa. Nke a bụ ihe eze sịrị, Unu ekwela ka duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu. Unu ekwela ka mee ka unu tụkwasị anyị obi, mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị. A gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’ “Unu aṅakwala ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya: ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị jupụtara nʼime ya. “Unu ekwela ka rafuo unu mgbe ọ na-asị, ‘Onyenwe anyị ga-anapụta anyị.’ O nweela chi niile nke ndị mba ọzọ, nke napụtarala ala ha site nʼaka eze Asịrịa. Olee ebe ka chi ndị na nọ? Olee ebe ka chi ndị nọkwa? Ha anapụtala site nʼaka m? Olee chi nʼime chi mba ndị a niile, bụ ndị zọpụtarala ala ha site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na anyị pụrụ ịzọpụta site nʼaka m?” Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.” Mgbe ịm nwa , onyeisi ọchịchị, na ode akwụkwọ eze, na nwa , ode akwụkwọ akụkọ eze laghachikwuuru , ha dọwara uwe ha mgbe ha na-aga igosi ya ịda mba nke obi ha. Ha gwakwara ya ihe niile onyeisi agha ndị Asịrịa kwuru.
Every verse in Isaiah 36
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.