Jeremiah 11:8
“Ma ha jụrụ ige ntị. Ha akpọkwaghị okwu m mkpa dịrị ha. Kama ha jegharịrị nʼisiike nke obi ọjọọ ha. Ọ bụ nke a mere m ji mee ka ọbụbụ ọnụ niile nke ya na ọgbụgba ndụ ahụ so bịakwasị ha, dịka m buru ụzọ nye nʼiwu, ma ihe ndị a emeghị ka ha jezie ije.’ ””
Jeremiah 11:8 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 8 of 23 in Jeremiah chapter 11 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Jeremiah 11 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nke a bụ okwu nke sị nʼebe anyị nọ bịakwute , “Gee ntị nʼihe niile metụtara ọgbụgba ndụ a, gwakwa ndị , na ndị bi na . Gwa ha na nke a bụ ihe anyị, Chineke kwuru, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-adịghị edebe ihe niile banyere ọgbụgba ndụ a, bụ nke m nyere nna nna unu ha, mgbe m si nʼ, site nʼoke ọkụ e ji agbaze igwe, kpọpụta ha.’ Asịrị m, Ruberenụ m isi, meekwa ihe niile m nyere unu nʼiwu, unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụkwa unu. ‘Mgbe ahụ, aga m emezu iyi ahụ m ṅụụrụ nna nna unu ha, inye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,’ ya bụ, ala ahụ unu bi nʼime ya taa.” m sị, “Amen, Onyenwe anyị.” Onyenwe anyị sịrị m, “Kpọsaa okwu ndị a nʼobodo niile, na nʼokporoụzọ niile, ‘Geenụ ntị nʼiwu nke ọgbụgba ndụ ahụ, ma mezuo ihe o kwuru. Site nʼoge ahụ m si nʼala kpọpụta nna nna unu ha ruo taa, adọọla m unu aka na ntị mgbe mgbe sị, “Ruberenụ m isi.” Ma ha jụrụ ige ntị. Ha akpọkwaghị okwu m mkpa dịrị ha. Kama ha jegharịrị nʼisiike nke obi ọjọọ ha. Ọ bụ nke a mere m ji mee ka ọbụbụ ọnụ niile nke ya na ọgbụgba ndụ ahụ so bịakwasị ha, dịka m buru ụzọ nye nʼiwu, ma ihe ndị a emeghị ka ha jezie ije.’ ” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Achọpụtala na-enwere njikọta na ịgba izu mmegide nʼetiti ndị na ndị bi na . Ha alaghachila azụ nʼụdị mmehie ahụ nna nna ha mehiere, bụ ndị ahụ jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha agbasoola chi ndị ọzọ na-efe ha. Ụlọ na ụlọ adịghị edebekwa ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara. Nʼihi ya, nke a bụ ihe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka mbibi, nke ha na-enweghị ike ịgbanarị, bịakwasị ha. Ọ bụrụkwa na ha akpọkuo m agaghị m aṅa ntị. Ndị obodo na ndị bi na ga-apụ kpọkuo chi ndị ahụ niile ha na-achụrụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ma chi ndị a agaghị enyere ha aka mgbe mbibi a bịakwasịrị ha. Gị, bụ , nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na .’ “Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha. “Gịnị ka onye m hụrụ nʼanya na-eme nʼime ụlọnsọ ukwuu m, mgbe ya na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejikọta onwe ha nʼotu ịtụ atụmatụ ihe ọjọọ? Anụ e doro nsọ apụghị ime ka ahụhụ unu kwesiri ịnata hapụ ịbịakwasị unu. A sị na o si otu a dịrị, mgbe ahụ, unu pụrụ ịṅụrị ọṅụ mgbe unu na-eme ihe ọjọọ unu.” Aha anyị nyere gị bụ oliv dị ndụ, nke na-amị mkpụrụ mara mma. Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ; alaka gị ga-agbajisikwa. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị na emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye . Ọ bụ anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ. Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya. Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya, ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ” Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya. Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m. Ya mere, nke a ka anyị na-ekwu banyere ndị ahụ na-achọ ịnapụ gị ndụ gị, ndị ahụ na-asị gị, “Ebukwala amụma site nʼaha anyị ka ị ghara ịnwụ nʼaka anyị.” Nʼihi nke a anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, sị, “Aga m ata ha ahụhụ. Ụmụ okorobịa ha ga-anwụ site na mma agha, ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. O nweghị ndị ga-afọdụ ndụ nʼime ha nʼihi na a ga-eme ka oke mbibi bịakwasị ndị nʼafọ ahụ m ga-ata ha ahụhụ.”
Every verse in Jeremiah 11
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.