Jeremiah
Jeremiah 47
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Jeremiah 47 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Okwu anyị nke ruru onye amụma ntị banyere ndị . Okwu ndị a bịara tupu ebuso obodo agha. Ihe ndị a ka anyị kwuru, “Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu; ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke. Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya, ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya. Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa, mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike. Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ, mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro, na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha. Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka, nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha. Nʼihi na ụbọchị ahụ abịala mgbe a ga-ebibi ndị niile, mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ, ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka. Nʼihi na anyị akwadoola ibibi ndị , o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri . ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ. A ga-eme ka ọn dere duu. Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ, unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị? “ ‘Ewoo, gị mma agha anyị, ole mgbe ị ga-ezu ike? Mịnye onwe gị nʼọbọ gị, kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’ Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike, ebe ọ bụ anyị nyere ya iwu ibu agha megide ọn, na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?”
Every verse in Jeremiah 47
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.