Job 34:25

“Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile, ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa.”

Job 34:25 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 25 of 37 in Job chapter 34 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Job 34 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ahụ sịrị: “Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe; gee m ntị unu ndị ikom nwere mmụta. Ntị na-anwale okwu dịka ire si anụ ụtọ ihe oriri. Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi; ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma. “ na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume, ma na-anapụ m ikpe ziri ezi. Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha ma a na-ahụta m dịka onye ụgha; ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’ Olee nwoke dịka , nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri? Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe. Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ ụtọ.’ “Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta. Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe nọ, bụ ime ajọ omume, bụrụkwa ihe dị anya nʼebe pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi. Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri. Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na pụrụ ime ihe na-ezighị ezi, na pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Onye họpụtara ya ịchị ụwa? Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile? Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya iweghachi mmụọ ya na nkuume ya, mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi, mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja. “Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a; gee ntị nʼokwu m. Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị? Ị ga-ama ezi omume na onye dị ike ikpe? Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’ ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’ Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze, onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye, nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya. Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị; ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga; a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ. “Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ; ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile. Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị, ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo. Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ, nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe. Na-ajụghị ajụjụ na-akụtu ndị a maara aha ha ma were ndị ọzọ dochie nʼọnọdụ ha. Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile, ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa. Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ nʼihi ajọ omume ha, nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha, ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla. Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị, nke mere na ọ nụrụ akwa ndị nọ na mkpa. Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe? Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya? Ma ya onwe ya na-achị isi nʼebe mmadụ na mba nọ, igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu ịchị obodo, ka ọ gharakwa ịbụ ihe ọnya nye ndị mmadụ. “Ọ bụrụ na mmadụ a sị , ‘Abụ m onye ikpe mara ma agaghị m emehie kwa ọzọ. Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị ịhụ; ọ bụrụ na m emehiela, agaghị m emekwa ya ọzọ.’ Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi gị mgbe ị jụrụ ichegharị? Gị onwe gị ga-ekpebi, ọ bụghị mụ; ya mere gwa m ihe ị mara. “Ndị ikom ndị nwere nghọta na-ekwu si, ndị amamihe nụrụ okwu m na-asị m, ‘ na-ekwu okwu dịka onye na-amaghị ihe; okwu ya dị ka nke onye na-enweghị uche.’ Ọ ga-adị nnọọ mma ma a sị na a nwaa ruo nsọtụ maka ọsịsa ya dịka nke ajọ mmadụ! Ọ na-atụkwasị nnupu isi nʼelu mmehie ya; na-akụ aka nʼetiti anyị nʼụzọ ịkwa emo, ma werekwa okwu nkwulu bara ụba megide .”

Every verse in Job 34

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00