Joshua

Joshua 8

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Joshua 8 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị , “Atụla egwu, adakwala mba. Chịrị ndị agha gị niile gaa , nʼihi na ugbu a, unu onwe unu ga-emeri ha. Aga m eme ka i merie eze ndị , na ndị ya na obodo ya, na ala ya. Ị ga-emekwa obodo na eze ya ihe i mere na eze ya. Ma ihe dị iche na nke a bụ na unu ga-edebere onwe unu ihe niile unu kwatara nʼagha, ya bụ anụ ụlọ niile na ngwongwo obodo ahụ niile. Jikerenụ ibuso ha agha. Ọ bụkwa nʼazụ obodo ha ka unu ga-esi lụso ha agha.” Mgbe ahụ, na ndị agha ya niile, biliri gaa ibuso agha. họpụtara iri puku ndị agha atọ zipụ ha nʼabalị o nyere ha iwu a, “Lee! Unu ga-aga zoo onwe unu nʼọhịa dị nʼazụ obodo . Unu ezola onwe unu nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ, kama nọọnụ nso, nọọkwanụ na njikere. Mụ na ndị niile so m ga-abịaru obodo ahụ nso. Mgbe ha ga-apụta ịlụso anyị ọgụ dịka ha mere na mbụ, anyị ga-agbakwa ọsọ nʼihu ha, Ha ga-achụ anyị ọsọ, tutu ruo mgbe anyị mere ka ha niile hapụ nʼobodo ha pụta. Nʼihi nʼuche ha, ha ga-asị, ‘Ha na-agbara anyị ọsọ dịka ha mere na mbụ, bịanụ ka anyị chụọ ha ọsọ gbuo ha.’ Ya mere, dịka anyị na-agbapụ site nʼebe ha nọ, unu ga-esite nʼebe unu zoro onwe unu bilie, nweta obodo ahụ, nʼihi na anyị unu ga-enyefe ya nʼaka unu. Mgbe unu weere obodo ahụ, unu ga-esunye obodo ahụ ọkụ. Meenụ ihe anyị nyere nʼiwu. Hụnụ na unu mezuru ihe ndị a m nyere unu nʼiwu.” Mgbe nyesịrị ha iwu ndị a, o zipụrụ ha. Ha hapụkwara nʼabalị ahụ gaa zoo onwe ha nʼọhịa dị nʼetiti na ọdịda anyanwụ . Ma na ndị agha ndị ọzọ fọdụrụ nọdụrụ nʼabalị ahụ nʼetiti ndị . Nʼisi ụtụtụ echi ya, chịkọtara ndị agha ya, ya na ndị ndu gara nʼihu ha, ruo . Ndị agha niile ha na ya so, chere ihu ha gaa nso obodo ruo nʼihu ya. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu obodo , ndagwurugwu bụ ihe kewara ha na obodo ahụ. chịịrị ihe ruru puku ndị agha ise, zoo ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ obodo ahụ, nʼetiti na . Ya mere, ndị agha were ọnọdụ ha nʼusoro, ndị ga-ebu agha nọ nʼakụkụ ugwu, ndị niile zoro onwe ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo ahụ. Ma nʼabalị ahụ, gara nọdụ na ndagwurugwu ahụ. Mgbe eze hụrụ nke a, ya na ndị ikom obodo ahụ niile mere ngwangwa pụọ nʼisi ụtụtụ izute ndị nʼotu ebe, nke chere ihu nʼ. Ma ọ mataghị na o nwere ndị agha zubere imegide ya ndị zoro onwe ha nʼọhịa dị nʼazụ obodo. na ndị niile mere ka ha chụghachi ha azụ site nʼihu ha, ha gbara ọsọ na-aga akụkụ ọzara ahụ niile dịka ndị e meriri emeri. Nʼihi nke a, a kpọkuru ndị ikom niile nọ nʼime obodo sị ha pụta bịa chụọ ụmụ ọsọ, ha chụrụ na-aga, e si otu a rapụta ha nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ. Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na maọbụ na . Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị ọsọ. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ sị ya, “Setịpụ ùbe dị gị nʼaka nʼụzọ , nʼihi na aga m enye gị obodo a.” mere dịka anyị gwara ya. Mgbe ndị agha ahụ zoro onwe ha nʼime ọhịa lere anya hụ na setịrị aka ya, ngwangwa, ha wụpụtara site nʼebe ha zoro onwe ha, gbara ọsọ gbaba nʼobodo , merie ya, mụnye ya ọkụ. Ma mgbe ndị agha lere anya nʼazụ, hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo ha na-alali elu, ha dara mba nʼime onwe ha. Ohere ọbụla adịghịkwa nye ha ịgbalaga gaa otu ụzọ maọbụ ụzọ ọzọ. Nʼihi na ndị ahụ buuru ụzọ gbaa ọsọ, ndị ahụ gbara na-aga nʼọzara, chigharịrị bido ịlụso ndị agha ahụ na-achụ ha ọsọ ọgụ. Nʼihi na mgbe na ndị agha so ya lepụrụ anya hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo na-arịgo elu, ha matara na ndị ha zoro onwe ha nʼọhịa abanyela obodo , lụgbuo ya. Ya mere, na ndị agha so ya tụgharịrị bido igbu ndị agha obodo . Ndị agha ahụ gara kpọọ obodo ahụ ọkụ pụtakwara, site nʼobodo ahụ, bido ịlụso ndị agha ọgụ. Nke a mere ka ndị agha nọdụ nʼetiti ụzọ ndị agha abụọ. Otu nʼihu ha, ndị nke ọzọ nʼazụ ha. Ya mere, ndị agha menyụrụ ha anya, gbuo ha, ruo na ọ dịkwaghị otu onye fọdụrụ nʼime ha, maọbụ onye gbapụrụ agbapụ. Naanị eze ka e jidere na ndụ. A kpọtakwara ya bịaruo nʼebe nọ. Mgbe ndị agha gbusịrị ndị agha niile nọ nʼọhịa na nʼọzara, ha lọghachiri azụ gbuo ndị niile fọdụrụ nʼime obodo ahụ. Ndị niile e gburu nʼụbọchị ahụ, ma nwoke ma nwanyị dị puku iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị niile nọ nʼobodo ahụ ka e gburu. Nʼihi na nọgidere setịpụ ùbe o ji nʼaka ya, megide obodo , tutu e bibie ndị niile nọ nʼobodo ahụ kpamkpam. Ma ndị kwaara anụ ụlọ, na ihe nkwata nʼagha nke obodo ahụ, dịka okwu anyị nyere nʼiwu si dị. Ya mere, kpọrọ obodo ọkụ, mee ya ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu ruo taa. Ma kwụbara eze ndị nʼelu osisi site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Mgbe anyanwụ dara, nyere iwu ka e wedata ozu eze site nʼosisi ahụ, tụsa ya nʼihu ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, ha tụkọtara ọtụtụ nkume nʼelu ya. Nkume ahụ ha tụkọtara dịkwa nʼebe ahụ ruo taa. Mgbe ahụ, wuuru anyị, Chineke ebe ịchụ aja nʼelu ugwu , dịka onyeozi anyị nyere ndị nʼiwu. O wuru ya dịka ihe e dere nʼakwụkwọ iwu si dị, ebe ịchụ aja a na-ejighị nkume a wara awa wuo, nkume a na-ejighị ngwa ọrụ igwe waa. Nʼelu ebe ịchụ aja a ka ha chụụrụ anyị aja nsure ọkụ na aja udo. Ma mgbe ndị nọ na-ele anya, depụtara iwu ndị ahụ nyere ha nʼelu nkume. Izrel niile, ha na ndị okenye ha, na ndị ọchịagha ha, na ndị ikpe ha, guzo nʼakụkụ abụọ nke igbe ọgbụgba ndụ anyị, na ncherita ihu ndị nchụaja, bụ ndị ị ndị na-ebu ya. Ma ndị ọbịa bi nʼetiti ha, ma ndị amụrụ nʼala ahụ nọ nʼebe ahụ. Ọkara nʼime ha gara guzo nʼakụkụ ugwu , ọkara ndị ọzọ guzoro nʼakụkụ ugwu , dịka onyeozi anyị nyere nʼiwu na mbụ, na ha ga-agọzi ndị . Emesịa, gụpụtara na ntị ha, okwu niile nke iwu ahụ, ya na ngọzị na ọbụbụ ọnụ so ya, dịka ihe niile e dere nʼụkwọ si dị. Iwu niile nyere ha ka gụpụtara na ntị ndị niile. Ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa niile bi nʼetiti ụmụ so nọkọọ nʼoge a ndị niile zukọrọ.

Every verse in Joshua 8

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00