Nehemiah

Nehemiah 10

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Nehemiah 10 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ndị tinyere aka, nʼakwụkwọ ahụ bụ: Onyeisi ọchịchị: Nehemaya nwa . Zedekaya, Ndị ọzọ bụ , Azaraya, Jeremaya, Pashua, Amaraya, Malkija, Hatush, Shebanaya, Maluk, Harim, Meremot, Ọbadaya, , Gineton, Baruk, Meshulam, Abija, Mijamin, Maazaya, Bilgai na . Ndị a bụ ndị nchụaja. Ndị ị so tinye aka ha nʼakwụkwọ bụ, Jeshua nwa , Binui otu nʼime ụmụ , Kadmiel, ndị so ha na-arụ ọrụ: Shebanaya, Hodia, Kelita, Pelaia, Hanan, Mika, Rehob, Hashabaya Zakua, Sherebaya, Shebanaya, Hodia, Bani na . Ndịisi ọchịchị tinyere aka ha bụ, Parosh, Pahat-, , Zatu, Bani, Buni, Azgad, Bebai, Adonaịja, Bigvai, Adin, Atea, Hezekaya, Azoa, Hodia, Hashum, Bezai, Harif, Anatot, Nebai, Magpịash, Meshulam, Hezia, Meshezabel, Zadọk, Jadua, Pelataya, Hanan, Anaia, Hoshea, Hananaya, Hashub, Halohesh, Pilha, Shobek, Rehum, Hashabna, Maaseia, Ahaya, Hanan, Anan, Maluk, Harim na . “Ndị ọzọ fọdụrụ bụ ndị nchụaja, ndị ị, ndị nche, ndị ọbụ abụ, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ndị ahụ niile sitere nʼirube isi nʼiwu wezuga onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ ahụ bi ha gburugburu nọ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị niile tozuru ịghọta ihe. Ndị a niile sooro ụmụnne ha ndị a na-asọpụrụ, jikọtaa onwe ha nʼọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi ịgbaso iwu , nke o nyere site nʼaka , bụ ohu ; na ilezi anya rube isi nʼihe niile enyere nʼiwu, ntụziaka niile na ụkpụrụ niile nke anyị bụ anyị. “Anyị kpebikwara na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom agaghị alụ di maọbụ nwunye site na mba ọzọ. “Anyị kpebikwara na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eburu ngwa ahịa ha maọbụ mkpụrụ ubi ha bịa ire ya nʼụbọchị izuike, maọbụ nʼụbọchị ọzọ dị nsọ, anyị agaghị azụ ihe ọbụla. Anyị na-ekpebikwa na anyị agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼafọ nke asaa niile, kwekọọkwa na anyị ga-agbaghara ụmụnna anyị niile ji anyị ụgwọ nʼafọ ahụ. “Anyị kwekọrịtakwara na anyị ga-atụ ụtụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke otu afọ niile maka iji kwadoo ọrụ ụlọnsọ ukwu , maka ime ka ihe ndị a dịrị nʼụlọnsọ ukwu ahụ: achịcha nsọ, onyinye ọka nke ụbọchị niile, aja nsure ọkụ na onyinye nke ụbọchị izuike, mmemme ọnwa ọhụrụ niile, ha na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka, maka aja dị nsọ niile na aja ikpuchi mmehie ndị , maka ozi niile a na-aga nʼụlọnsọ anyị. “Anyị bụ ndị nchụaja, ndị ị na ndị ọzọ, ejirila ife nza chọpụta mgbe ezinaụlọ ọbụla nʼetiti anyị ga-eji bubata nku nʼụlọ anyị nʼoge ya kwa afọ, maka ebe ịchụ aja nke anyị anyị dịka e dere ya nʼiwu. “Anyị kpebikwara na mmadụ niile nʼotu nʼotu ga na-ewebata mkpụrụ mbụ nke ihe ubi ya nʼụlọnsọ anyị, na mkpụrụ osisi ọbụla, maọbụ ihe ubi ndị ọzọ. “Dịka e dere ya nʼ, anyị ga-ewebata ụmụ ndị ikom mbụ anyị, na nwa mbụ nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ anyị niile, nʼụlọ anyị. A ga-enye ha ndị nchụaja na-eje ozi nʼebe ahụ. “Karịsịa, anyị ga-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ anyị, nyekwa ha ndị nchụaja, ụtụ ọka mbụ anyị kwọrọ, ya na onyinye ndị ọzọ nke mkpụrụ ubi mbụ anyị, dịka mmanya vaịnị mbụ, mmanụ oliv mbụ na mkpụrụ osisi ndị ọzọ. Anyị kpebikwara inye ndị ị otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile anyị nwetara nʼubi anyị, nʼihi na ọ bụ ọrụ ndị ị ịnakọta otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼobodo niile ebe anyị na-arụ ọrụ. Ndị nchụaja bụ ụmụ ụmụ Erọn ga-eso ndị ị mgbe ha na-anakọta onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ndị a. Ha ga-ewekọta ihe ndị a niile webaa ha nʼụlọ anyị, ruo nʼime ọnụụlọ ịchịkọba ihe, nke ụlọakụ. Ndị na ndị ị, kwesiri iweta onyinye ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv nʼime ụlọ ịchịkọba ihe, nʼebe a na-edebe ngwongwo niile e ji eje ozi nʼụlọ ukwu ahụ, nke ndị nchụaja na-eje ozi, ndị nche na nke ndị ọbụ abụ. “Anyị agaghị agbakụtakwa ụlọ anyị azụ.”

Every verse in Nehemiah 10

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00