Numbers

Numbers 17

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Numbers 17 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara okwu sị ya, “Gwa ụmụ okwu, sitekwa nʼaka ha nata mkpanaka iri na abụọ otu mkpanaka nʼisi onyendu nke ebo ọbụla. Dekwasị aha onyendu ọbụla nʼahụ mkpanaka nke ya. Ma nʼelu mkpanaka ị dekwasị aha Erọn. A ga-enwe otu mkpanaka maka onyendu ebo ọbụla. Tinye mkpanaka ndị a niile nʼime ụlọ nzute, nʼihu ahụ, ebe m na-ezute gị. Mkpanaka nke onye ahụ m họpụtara ga-ama ifuru ndụ. M ga-ewezugakwa ntamu niile nke ndị site nʼebe m nọ, bụ nke ha na-atamu megide unu.” Ya mere, Mosis gwara ndị okwu ndị a. Ndị ndu ha nyere ya mkpanaka iri na abụọ, otu mkpanaka nʼisi otu onyeisi maka onyeisi ebo ha nʼotu nʼotu. Mkpanaka Erọn dịkwa nʼetiti nke ha. Mosis chịịrị ha niile dozie ha nʼihu anyị nʼime ime ụlọ nzute ahụ. Nʼechi ya, Mosis banyere nʼụlọ nzute ahụ chọpụta na ọ bụghị naanị na mkpanaka Erọn, onye nọchitere anya ebo ị, amaala ifuru, kama na ọ waala okoko ma mịakwa mkpụrụ osisi chara acha a na-akpọ alụmọnd. Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu anyị wepụta mkpanaka ndị ahụ niile gosi ha ndị niile. Ha hụrụ ha, ma nwoke ọbụla weghachiri mkpara osisi nke ya. Onyenwe anyị gwara sị, “Tinye mkpanaka Erọn nʼihu ahụ, ka ọ dịgide nʼebe ahụ dịka ihe ama nye ndị nnupu isi. Nke a ga-eme ka ntamu ndị a megide m kwụsị, ka ha ghara ịnwụ.” Ya mere, Mosis mezuru ihe niile dịka anyị nyere ya nʼiwu. Ma ndị zara sị ya, “Ndị nwụrụ anwụ ka anyị bụ! Ofufu ka anyị furu. Nʼezie anyị bụ ndị furu efu. Onye ọbụla bịaruru nso ebe obibi anyị ga-anwụ. Anyị niile ga-anwụ?”

Every verse in Numbers 17

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00