Philemon
Philemon 1
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Philemon 1 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Pọl, onye e tinyere nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ịst ọs na site nʼaka nwanna anyị , Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Fịlịmọn. Anyị na-edetakwara ya nzukọ ịst dị nʼụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na onye anyị na ya so na-alụ agha a. Ka amara na udo nke sitere na bụ , na ịst ọs anyị dịrị unu. Ana m ekele ekele mgbe ọbụla m na-echeta gị nʼekpere niile m na-ekpe. Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime anyị ọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile. Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime ịst. Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị. Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime ịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a. Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi ịst ọs na-arịọ gị arịrịọ a. Biko, arịọ m gị nʼisi ọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ. Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru. Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi m ka m na-ezitere gị. Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma. Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta. Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi. Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime anyị. Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m. Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nʼụzọ ọbụla, ọ bụrụkwa na o ji ụgwọ ọbụla, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị. Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị. Nwanna m, mere m ihe a m na-arịọ gị nʼihi anyị. Mekwa ka obi m dị ọhụrụ nʼime ịst. Olileanya m siri m ike na ị ga-aṅa m ntị, ana m edere gị akwụkwọ a, na ị ga-eme, ma karịakwa ka m rịọrọ. Ihe ọzọkwa, bụ na m chọrọ ka ị kwadoro m ọnụụlọ ebe m ga-anọ dị ka ọbịa ma m bịa, maka enwere m olileanya na a ga-aza ekpere unu ime ka m si nʼebe a pụta bịakwute unu. Epafras, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ịst ọs na-ekele gị. Mak, na Arịstakọs, na , na , ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu. Ka amara anyị ọs ịst dịnyere mmụọ unu.
Every verse in Philemon 1
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.