Psalms

Psalms 77

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Psalms 77 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Etikuru m nʼoke olu maka enyemaka; etikuru m mkpu ka ọ nụrụ olu m. Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ anyị ka m chọrọ. Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị, mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi. O , echetara m gị, sụkwaa ude; echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. I kweghị ka anya m abụọ mechie; nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu. Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga, na afọ niile ndị gara aga. Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị. Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ. “Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi? Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ? Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla? Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi? Chineke, o chefuola i mere anyị ebere? O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m, afọ niile mgbe kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya. Aga m echeta ọrụ niile anyị rụrụ; e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga. Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile, tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.” O , ụzọ gị niile dị nsọ. Olee chi dị ukwuu dịka anyị? Ị bụ onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche; ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ. I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị, bụ ụmụ ụmụ ọb na . Osimiri hụrụ gị, O , osimiri hụrụ gị, taa; ogbu mmiri mere mkpọtụ. Igwe ojii wụpụrụ mmiri, mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe; àkụ gị gburu amụma ebe niile. A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe, amụma gị nyere ụwa niile ihe; elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu. Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara, ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri, ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya. I sitere nʼaka na Erọn duo ndị gị dịka igwe atụrụ.

Every verse in Psalms 77

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00