Revelation
Revelation 7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Revelation 7 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi. Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri, na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke anyị akara nʼegedege ihu ha.” Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke . Ndị a kara akara site nʼebo dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). E sitere nʼebo họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sitekwara nʼebo ị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). E sitere nʼebo họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo ọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sitere nʼebo ị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). E sitere nʼebo ụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sikwa nʼebo dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha. Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị, “Nzọpụta dịrị anyị, onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, dịkwara atụrụ ahụ.” Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa ofufe, na-asị, “Amen! Ngọzị niile na otuto niile, na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile na ike niile na ume niile, dịrị anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.” Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?” Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Atụrụ ahụ. Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha. ‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla. Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’ okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ. Nʼihi na Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha; ‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’ ‘ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’”
Every verse in Revelation 7
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.