Zechariah
Zechariah 6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Zechariah 6 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Elelikwara m anya elu ọzọ hụ ụgbọ ịnyịnya anọ nke si nʼetiti ugwu abụọ na-apụta. Ugwu ndị a bụ ugwu e ji bronz mee. Ụgbọ ịnyịnya nke mbụ ka ịnyịnya na-acha ọbara ọbara na-adọkpụ. Nke abụọ ka ịnyịnya na-eji nji na-adọkpụ. Nke atọ ka ịnyịnya dị ọcha na-adọkpụ, ma nke anọ ka ịnyịnya tụrụ agwa siekwa ike na-adọkpụ. Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Gịnị ka ihe ndị a bụ, nna m ukwu?” Mmụọ ozi ahụ zara m, sị, “Ndị a bụ mmụọ anọ nke eluigwe, ka ha na-apụ mgbe ha guzochara nʼihu elu ụwa niile. Ụgbọala nke ịnyịnya ndị dị oji na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ugwu. Nke ịnyịnya ndị dị ọcha na-adọkpụ na-aga nʼọdịda anyanwụ. Nke ahụ ndị ịnyịnya na-adịghị ezi ọcha na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ndịda.” Mgbe ịnyịnya ndị ahụ dị ike pụtara, chọọ ka e nye ha ike ijegharị nʼụwa niile, ọ gwara ha sị, “Gaanụ jegharịa nʼụwa niile.” Nʼihi ya, ha pụrụ jegharịa nʼụwa niile. Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Ndị ahụ jere nʼakụkụ ugwu emeela ka Mmụọ m dajụọ nʼala dị nʼakụkụ ugwu.” Okwu anyị ruru m ntị, sị, “Gaa nata , Tobaija na , ndị a dọtara nʼagha si ọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ nwa . Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị nwa bụ onyeisi nchụaja nʼisi. Gwa ya na ihe ndị a ka anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ . Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke anyị. Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’ Okpueze ahụ ka a ga-enye , Tobaija, Jedaya na , nwa , ka ọ bụrụ ihe ncheta nʼụlọnsọ ukwu nke anyị. Ndị nọ nʼebe dị anya ga-esi ebe ahụ bịa nye aka nʼọrụ iwu ụlọnsọ ukwu nke anyị. Unu ga-amatakwa na ọ bụ anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. Ihe ndị a niile ga-eme ma ọ bụrụ na unu akpachapụ anya rubere anyị unu isi.”
Every verse in Zechariah 6
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.