1 Corinthians 13:2

“A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla.”

1 Corinthians 13:2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 2 of 13 in 1 Corinthians chapter 13 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 Corinthians 13 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda. A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla. A sịkwa na m ewere ihe niile m nwere nye ndị ogbenye, werekwa anụ ahụ m nye ka ere ya ọkụ nʼihi ka m nyaa isi, ihe ndị a niile abaghị uru, ma m enweghị ịhụnanya. Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu. Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya. Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu. Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara. Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma niile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma niile ga-agabiga. Nʼihi na ọmụma anyị ezughị oke, ibu amụma anyị ezukwaghị oke. Ma mgbe anyị ruru nʼizuoke, ezughị oke agaghị adịkwa. Mgbe m bụ nwata, ekwuru m okwu dịka nwata, echiche m niile bụ echiche nwata. Izuzu obi m niile bụkwa nke nwata. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịghịkwa m akpa agwa dịka nwata ọzọ. Ugbu a, anyị na-ahụ inyogho inyogho dịka anyị na-ele anya nʼenyo ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihu na ihu. Ugbu a, ihe m mara ezughị oke, ma mgbe ahụ aga m amazu, dịka m bụ onye a mazuru. Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nʼime ha niile, ihe kachasị ha niile bụ ịhụnanya.

Every verse in 1 Corinthians 13

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00