1 Corinthians 16:9
“nʼihi na-emegheela ọnụ ụzọ dị ukwuu nke na-arụpụta ezi ọrụ nye m, ma ha dị ọtụtụ bụ ndị na-eguzogide m.”
1 Corinthians 16:9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 9 of 24 in 1 Corinthians chapter 16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
1 Corinthians 16 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ ịa nʼiwu. Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara. Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na onyinye obiọma unu. Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro. Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị . Nʼihi na ana m ezube isi nʼụzọ abịa. Mgbe m bịara, ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site, nʼinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ileta unu ugbu a m nọ nʼije ngafere. Kama ana m ezube ịbịa nọnyere unu nwa oge, ma ọ bụrụ na anyị e kwenye. Ma aga m anọ nʼọs tutu ruo oge ọọsụ, nʼihi na-emegheela ọnụ ụzọ dị ukwuu nke na-arụpụta ezi ọrụ nye m, ma ha dị ọtụtụ bụ ndị na-eguzogide m. Ọ bụrụ na abịa, lezienụ anya mee ka ọ ghara inwe ihe ọ ga-atụ egwu mgbe ọ nọ nʼetiti unu, nʼihi na ọ bụ onye na-arụ ọrụ anyị dịka m si arụ ya. Ka onye ọbụla ghara ileda ya anya. Kama, dupunụ ya nʼije ya nʼudo ka o nwe ike lọghachikwute m. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-ele anya nlọta ya. Arịrịọ m nwanne anyị Apọlọs ka o soro ụmụnna ndị ọzọ bịa leta unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịakwute unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọbụla ohere pụtara. Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike. Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ. Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala ịa. Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi. Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị. Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke na Fọtunetus na ọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a. Ha kwalitere mmụọ m dịka ha kwalitere nke unu. Nyenụ ndị dị otu a nsọpụrụ. Ụlọ chọọchị niile dị nʼokpuru ịa na-ezitere unu ozi ekele. Akwila na , na nzukọ dị nʼụlọ ha na-enye unu ekele obiọma nʼime anyị. Ụmụnna niile nọ nʼebe a na-ekele unu. Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu. Ọ bụ mụ onwe m bụ Pọl ji aka m na-ede ekele nke a. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụghị anyị nʼanya, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Onyenwe anyị bịa! Ka amara anyị ọs dịnyere unu. Ka ịhụnanya m dịnyere unu niile site nʼ anyị ọs ịst. Amen.
Every verse in 1 Corinthians 16
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.