1 John 4:5

“Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị.”

1 John 4:5 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 5 of 21 in 1 John chapter 4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 John 4 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na , nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa. Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke : Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na ọs ịst abịala nʼanụ ahụ sitere na . Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta ọs esiteghị na , mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide ịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa. Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na , unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa. Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị. Anyị sitere na , onye ọbụla maara na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha. Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na , ọ makwara . Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị , nʼihi na bụ ịhụnanya. E siri otu a mee ka ịhụnanya nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị. Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya. O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị. O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya. Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ nzọpụta nke ụwa. Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na ọs bụ Ọkpara . Onye dị otu a bikwa nʼime . Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime . Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a. Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a. Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya. Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya. Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya. Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.”

Every verse in 1 John 4

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00