1 Kings 18:40

“Mgbe ahụ, Ịlaịja nyere ha iwu sị, “Jidenụ ndị amụma Baal niile. Unu ekwekwala ka otu onye nʼime ha laa.” Ha jidekwara ha niile. Ịlaịja dukwaara ha niile gaa na ndagwurugwu iyi Kishọn, gbuo ha nʼebe ahụ.”

1 Kings 18:40 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 40 of 46 in 1 Kings chapter 18 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 Kings 18 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nʼafọ nke atọ, okwu anyị rutere Ịlaịja ntị, “Bilie, gaa gosi onwe gị. Aga m emekwa ka mmiri zookwa nʼala a.” Ya mere, Ịlaịja pụrụ gaa igosi onwe ya. Ma ụnwụ dị na nʼoge a siri nnọọ ike. O nwere otu nwoke na-elekọta ihe dị nʼezinaụlọ . Aha ya bụ Ọbadaya. (Ọ bụ nwoke ji obi ya niile kwere na anyị. Mgbe eze nwanyị bụ na-egbu ndị amụma anyị chọọ igbuchapụ ha, ọ bụ Ọbadaya zoro narị ndị amụma nʼime ha nʼime ọgba nkume. O zoro iri ndị amụma ise nʼotu ọgba nkume, zookwa iri ndị amụma ise fọdụrụ nʼime ọgba nkume ọzọ. Emesịa, ọ na-ewegara ha nri na mmiri nʼebe ahụ.) Ehab kpọrọ Ọbadaya sị ya, “Jegharịa nʼala a niile nyochapụta na ndagwurugwu na isi iyi niile, ebe ahịhịa ndụ dị. Gbutere ịnyịnya na ịnyịnya muul m ahịhịa ahụ ka ha taa ghara ịnwụ, ka anyị gharakwa igbu ha.” Ha kere ala ahụ nʼetiti onwe ha. Ehab sitere otu akụkụ, ma Ọbadaya sitere akụkụ nke ọzọ. Ọ dịghị anya, na mberede, Ọbadaya hụrụ Ịlaịja ka ọ na-abịa izute ya. Ọbadaya matara na ọ bụ ya. Nʼihi ya, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala sị, “Ọ bụ gị ka m hụrụ nʼezie, onyenwe m, Ịlaịja?” Ịlaịja zara sị ya, “E, ọ bụ m. Ugbu a gaa gwa onyenwe gị, ‘mụ bụ Ịlaịja nọ nʼebe a.’ ” Mgbe ahụ, Ọbadaya jụrụ Ịlaịja sị, “Gịnị bụ ihe m mejọrọ, nke mere i ji na-achọ inyefe ohu gị nʼaka ka o gbuo ya? Dịka anyị gị sị adị ndụ, o nwebeghị mba maọbụ alaeze dị nke nna m ukwu na-ezigaghị mmadụ ịchọ gị. Ebe ọbụla ọ gara a na-akọrọ ya na Ịlaịja anọghị nʼebe ahụ. Ehab na-eme ka eze obodo ahụ ṅụọ iyi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Ma ugbu a, ị na-asị m gaa gwa m na, ‘Ịlaịja nọ nʼebe a.’ Ọ bụrụkwanụ na m esite nʼebe a pụọ, onye ma ebe Mmụọ anyị ga-ebuga gị. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na abịa hapụ ịhụ gị, ọ ga-egbu m. Nʼihi na mụ bụ ohu gị bụ onye na-efe anyị ofufe siterị na mgbe m bụ okorobịa. Ọ bụ na onyenwe m anụghị ihe m mere mgbe nọ na-egbu ndị amụma anyị? E zoro narị ndị amụma anyị nʼime ọgba nkume abụọ, iri ise nʼime otu ọgba nkume, iri ise nʼime otu ọgba nkume ka m zoro ha, jirikwa nri na mmiri ọṅụṅụ zụọ ha. Ma ugbu a i na-agwa m sị m, ‘Gaa gwa onyenwe gị na Ịlaịja abịala.’ Ọ ga-egbukwa m!” Ma Ịlaịja zara sị ya, “Dịka anyị pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, onye m na-ejere ozi, ana m agwa gị na agaghị m esi nʼebe a pụọ tutu ruo mgbe m gosiri onwe m taa.” Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja. Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa ahụ?” Ịlaịja zara sị , “O nweghị mgbe m ji butere nsogbu. Ọ bụ gị onwe gị na ezinaụlọ nna gị na-ebutere nsogbu. Unu agbakụtala iwu anyị azụ, gbasoro chi dị iche iche. Ugbu a, kpọkọta ndị niile ka ha zute m nʼugwu . Kpọpụtakwa ndị amụma ọnụọgụgụ ha dị narị anọ na iri mmadụ ise, na ndị amụma , ndị dị narị anọ, bụ ndị na-eso eze nwanyị erikọ ihe na tebul ya.” Ehab zigara ozi kpọkọta ndị niile, na ndị amụma ahụ niile. Ha niile bịakwara nʼugwu . Ịlaịja gara nʼihu ndị a, sị ha, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka unu ga-akwụsị inwe obi abụọ? Ọ bụrụ na anyị bụ unu, soronụ ya! Ma ọ bụrụkwanụ na unu ekpebie na bụ chi unu, soronụ ya.” Ma ndị zukọrọ nʼebe ahụ ekwughị ihe ọbụla. Mgbe ahụ Ịlaịja sịrị ha, “Leenụ! Ọ bụ mụ onwe m, naanị m, bụ onye amụma anyị fọdụrụ, ma ndị amụma dị narị anọ na iri ise nʼọnụọgụgụ. Ugbu a wetanụ oke ehi abụọ ka ndị amụma họrọ otu oke ehi, nke ha chọrọ. Ha ga-egbujasị ya, tụkwasị ya nʼelu nkụ dị nʼebe ịchụ aja, ma ha agaghị amụnye ọkụ ọbụla nʼokpuru ya. Mụ onwe m ga-akwado oke ehi nke ọzọ tụkwasị ya nʼelu nkụ ma agaghị m amụnyekwa ọkụ nʼokpuru ya. Emesịa, unu ga-akpọku chi unu, mụ onwe m kwa ga-akpọku aha anyị. Ọ ga-erukwa na chi ga-eji ọkụ za, chi ahụ bụ .” Ndị niile zara sị, “Okwu gị dị mma.” Ịlaịja gwara ndị amụma , sị, “Ebe unu dị ọtụtụ, burunu ụzọ họrọ otu oke ehi nʼime ehi abụọ a dozie ya. Unu amụnyekwala ya ọkụ nʼokpuru, kama kpọkuonụ chi unu.” Ya mere, ndị amụma weere oke ehi ahụ e nyere ha doziekwa ya. Mgbe ahụ, ha kpọkuru aha , chi ha. Site nʼụtụtụ tigide mkpu ruo nʼetiti ehihie na-asị “O , biko, zaa anyị.” Ma o nweghị ihe ha nụrụ site nʼọnụ . Ọ dịkwaghị onye zara ha. Ha malitere ite egwu gburugburu ebe ịchụ aja ahụ ha kwadoro. Nʼihe dị ka nʼetiti ehihie, Ịlaịja malitere ịchị ha ọchị, na ịkwa ha emo. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Tisienụ mkpu ike ka nwe ike ịnụ arịrịọ unu. Nʼezie, ọ bụ chi! Ma eleghị anya ọ nọ nʼoke echiche, maọbụ o ji ọrụ nʼaka, maọbụ ọ gara njem. Ma eleghị anya ọ na-arahụ ụra. Ọ chọrọ onye ga-akpọte ya.” Ndị amụma a tiri mkpu nʼoke olu dịka ha si eme. Ha ji mma na ùbe na-egbukasị onwe ha ahụ, tutu ruo mgbe ọbara malitere isite ha nʼahụ na-agbapụta. Ma mgbe etiti ehihie gasịrị, ha nọgidekwara na-ebu amụma ruo mgbe oge ịchụ aja uhuruchi ruru, ma o nweghị onye zara ha, o nwekwaghị olu a nụrụ. Ọ dịkwaghị onye ṅara ha ntị. Mgbe ahụ, Ịlaịja kpọrọ ndị sị ha, “Bịaruenụ m nso.” Ha niile bịaruru ya nso, o doziri ebe ịchụ aja anyị, bụ ndị ahụ a kwaturu nʼala na mbụ. Ịlaịja chịịrị nkume iri na abụọ, nke otu nʼime ha nọchiri anya otu ebo ọb, onye okwu anyị rutere si ya, “Aha gị ga-abụ .” O ji nkume ndị a wuzie ebe ịchụ aja anyị. Emesịa, o gwuru olulu miri emi, nke gbara ebe ịchụ aja ahụ gburugburu. Ọ tụkwasịrị nkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, tụkwasịkwa otu oke ehi o gbujasịrị nʼelu nkụ ndị ahụ. Emesịa, o nyere ndị nọ nʼebe ahụ iwu sị ha, “Gbajuonụ ite anọ mmiri. Butekwanụ mmiri ahụ bịa wụkwasị ya nʼelu aja nsure ọkụ a, na nʼelu nkụ ndị a.” ha mesiri nke a, Ịlaịja gwara ha okwu sị, “Gbajukwaanụ ite mmiri ndị ahụ, bute ha bịa wụkwasị mmiri ahụ nke ugboro abụọ nʼelu aja nsure ọkụ a.” Ha mere dịka Ịlaịja kwuru. Ịlaịja nyekwara ha iwu sị, “Gbajukwaanụ ya nke ugboro atọ, bịa wụkwasị ya.” Ha mekwara otu a. Mmiri jupụtakwara nʼebe ịchụ aja ahụ, na olulu ahụ dị ya gburugburu. Mgbe oge e ji achụ aja anyasị ruru, Ịlaịja, onye amụma bịara ebe ịchụ aja ahụ nso kpee ekpere sị, “O, Onyenwe anyị , na Aịzik, na , biko gosi taa na ọ bụ gị onwe gị bụ naanị nʼ, na mụ onwe m bụkwa ohu gị. Gosikwa na m bụ onyeozi gị, na ọ bụ ihe i nyere m nʼiwu ka m mere oge ndị a niile. Biko, Onyenwe anyị m, zaa m ekpere m, zaa m ya, ka ndị niile mata na gị onwe gị, Onyenwe anyị bụ , na gị onwe gị na-atụgharịkwa obi ha ịlaghachikwute gị.” Mgbe ahụ, na mberede, ọkụ anyị sitere nʼeluigwe daa, rechapụ oke ehi ahụ, na nkụ ahụ, na nkume, na ntụ, ma rechapụkwa mmiri niile dị nʼime olulu ahụ dị gburugburu ebe ịchụ aja ahụ. Mgbe ndị mmadụ ahụ niile hụrụ ihe a mere, ha niile dara nʼala kpuo ihu nʼala, na-eti mkpu na-asị, “Onyenwe anyị, ya onwe ya bụ ! Onyenwe anyị ya onwe ya bụ !” Mgbe ahụ, Ịlaịja nyere ha iwu sị, “Jidenụ ndị amụma niile. Unu ekwekwala ka otu onye nʼime ha laa.” Ha jidekwara ha niile. Ịlaịja dukwaara ha niile gaa na ndagwurugwu iyi ọn, gbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, Ịlaịja gwara okwu sị, “Gaa rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; nʼihi na anụrụ m ụzụ oke mmiri ozuzo ka ọ na-ada.” Nʼihi nke a, Ehab sitere nʼebe ahụ pụọ gaa iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma Ịlaịja rigooro nʼelu ugwu gbuo ikpere nʼala, kpuokwa ihu ya nʼala nʼetiti ikpere ya abụọ ikpe ekpere. Nʼoge a, ọ gwara nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Gaa lee anya nʼụzọ oke osimiri.” Ọ rịgoro lee anya, sị, “Ọ dịghị ihe ọbụla m hụrụ.” Ịlaịja gwakwara ya otu a, ugboro asaa, sị ya, “Jeghachi.” O ruo na nke ugboro asaa, nwokorobịa ahụ bịaghachiri sị Ịlaịja, “Onyenwe m, ahụrụ m igwe ojii dị nta dịka ọbụ aka mmadụ ka o si nʼoke osimiri na-apụta.” Ya mere, Ịlaịja sịrị, “Gaa gwa , ‘dozie ụgbọ agha gị, gbadaa tupu mmiri ozuzo egbochi gị ịla.’ ” Ọ dịghị anya, eluigwe gbajikọtara nnọọ oji. Oke ifufe bidokwara ife. Mmiri dị ukwuu bidokwara izo. Mgbe ahụ, Ehab gbaara ụgbọ agha ya laa . Ma ike anyị bịakwasịrị Ịlaịja. Ọ fanyere ọnụ uwe mwụda ya na belịt o kere nʼukwu, gbapụ ọsọ buru ụzọ gbaruo obodo .

Every verse in 1 Kings 18

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00