1 Kings 21:7
“Mgbe ahụ, nwunye ya Jezebel jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Ọ bụghị gị bụ eze na-achị Izrel? Bilie, rie nri, enyela obi gị nsogbu, nʼihi na aga m enyefe gị ubi vaịnị Nebọt onye Jezril nʼaka.””
1 Kings 21:7 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 7 of 29 in 1 Kings chapter 21 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
1 Kings 21 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe nwa oge nta gasịrị, Nebọt, onye , nwere ubi vaịnị dị na , nʼakụkụ ụlọeze bụ eze . Ehab sịrị ọt, “Nye m ubi vaịnị gị ka ọ bụrụ ubi a gbara ogige, ebe m ga-akụ akwụkwọ nri, ebe ọ dị nso nʼụlọeze m. Aga m enye gị ubi vaịnị ọzọ dị mma karịa ya, ma ọ bụrụkwa na ị chọrọ, aga m akwụ gị ego ọbụla o ruru nʼọnụ ahịa ya.” Ma ọt zara sị , “Ala a bụ ihe nketa ruuru m site nʼaka nna nna m ha. M ga-esi aṅaa nye gị ya. Onyenwe anyị ekwela na m ga-ewere ihe nketa nke nna nna m ha nye gị.” Ehab jiri obi ụfụ na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya nʼihi okwu a ọt, onye gwara ya, sị, “Agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m ha.” O dinara nʼihe ndina ya, chee ihu ya nʼaja ụlọ, jụ iri ihe ọbụla. Ma nwunye ya bụ , bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji jụ iri ihe? Gịnị mere i ji nọgide nʼobi ọjọọ na iwe?” Ehab zara sị ya, “Agwara m ọt, nwoke onye okwu sị ya, ‘Resi m ubi vaịnị gị, ma ọ bụrụ na ị chọrọ, aga m enye gị ala ubi ọzọ mara mma nʼọnọdụ ya.’ Ma ọ jụrụ jụwaa isi inye m ubi ahụ.” Mgbe ahụ, nwunye ya jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Ọ bụghị gị bụ eze na-achị ? Bilie, rie nri, enyela obi gị nsogbu, nʼihi na aga m enyefe gị ubi vaịnị ọt onye nʼaka.” Ya mere, dere akwụkwọ nʼaha , were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe ọt bi. Nʼime akwụkwọ ozi ndị a, o dere sị, “Nyenụ iwu ka mmadụ niile buo ọnụ. Kpọkọtaanụ ndị niile, ka ha zukọta. Mgbe unu zukọrọ, nyenụ ọt ọnọdụ nʼoche dị mkpa. Họpụtanụ ndị ikom abụọ, ndị na-abaghị uru ka ha pụta nʼihu nzukọ unu guzo gbaa ama ụgha megide ọt sị na ha nụrụ mgbe ọ kọchara na eze. Maanụ ya ikpe ọnwụ, kpụpụ ya nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya, ka ọ nwụọ.” Ndị okenye na ndị a na-asọpụrụ ndị bi nʼobodo ahụ mere dịka nyere nʼiwu nʼakwụkwọ ahụ o degaara ha. Ha nyere iwu maka ibu ọnụ, kpọọkwa nzukọ ndị obodo ahụ niile, meekwa ka ọt nọdụ nʼoche dị mkpa. Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ na-abaghị uru pụtakwara, nọdụ na ncherita ihu ya, ha gbara ama ụgha megide ọt, nʼihu ndị mmadụ, sị, “Nebọt kọchara na eze.” Nʼihi nke a, ha dọkpụụrụ ya gaa nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya. Emesịa, ndị okenye na ndị a maara aha ha nke obodo , ziri ozi zigara gwa ya na ọt anwụọla. Ngwangwa natara ozi na a tụgbola ọt, ọ sịrị , “Bilie, gaa nwetara onwe gị ubi vaịnị ọt, nwoke onye . Ubi ahụ ọ jụrụ inye gị nʼego abụrụla nke gị ugbu a nʼihi na ọt anwụọla. Ọ dịkwaghị ndụ ọzọ!” Mgbe nụrụ na ọt anwụọla, o biliri pụọ, gaa ịbanye nʼubi ahụ, inwetara onwe ya ubi vaịnị ọt, onye . Ma okwu anyị rutere Ịlaịja, onye , sị ya, “Bilie, gaa zute , eze onye bi na . Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị ọt inwetara ya onwe ya. Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka anyị kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara ọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’ ” Mgbe ahụ, Ehab jụrụ Ịlaịja ajụjụ sị ya, “Onye iro m, ị chọrọkwala m bịa?” Ịlaịja zara sị ya, “E, achọrọla m gị bịa nʼihi nnyefe i nyefere onwe gị ime ihe dị njọ nʼanya anyị. Ọ sịrị, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ dakwasị gị. Aga m ekpochapụ ndị agbụrụ gị, site nʼezinaụlọ bipụ nwoke ọbụla, maọbụ ohu maọbụ onyenwe onwe ya nʼ. Aga m eme ka ụlọ gị dịrị ka nke nwa , na dịka nke nwa , nʼihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka mehie.’ “Ma banyere , Onyenwe anyị sịrị, ‘Ụmụ nkịta ga-eri anụ ahụ nʼakụkụ mgbidi aja ụlọ dị nʼobodo .’ “Nkịta ga-eri anụ onye ọbụla si nʼezinaụlọ nke nwụrụ nʼime obodo, ma anụ ufe nke eluigwe ga-eri anụ ndị ọbụla nwụrụ nʼọhịa.” (Nʼezie, o nweghị onye ọbụla ọzọ dị ka , onye rere onwe ya nye ime ihe ọjọọ dị ukwuu nʼanya anyị, onye nwunye ya kwagidere ime ihe ọjọọ dị iche iche. Ehab bụ onye mere mmehie dị oke njọ nke ịgbaso na ife arụsị dị iche iche ofufe dịka ndị Amọrait mere, bụ ndị ahụ anyị sitere nʼala a chụpụ ime ka ndị nweta ala ha.) Mgbe nụrụ okwu amụma ndị a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, buo ọnụ, dinaa nʼakwa mkpe ahụ, jegharịakwa nʼịdị umeala. Ma okwu anyị rutere Ịlaịja, onye ọzọ, sị ya, “Ị hụrụ otu si weda onwe ya ala nʼihu m? Nʼihi ihe a o mere, iweda onwe ya ala nʼihu m, agaghị m eme ka ihe ọjọọ ndị a m kwuru okwu banyere ha rute ya nʼoge ọ dị ndụ. Kama aga m eme ka ihe ndị a dakwasị ezinaụlọ ya mgbe nwa ya ga-achị dịka eze.”
Every verse in 1 Kings 21
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.