1 Kings 8:9
“O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta.”
1 Kings 8:9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 9 of 66 in 1 Kings chapter 8 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
1 thread runs through this chapter
1 Kings 8 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe ahụ, eze ọn kpọkọtara ndị okenye , na ndịisi ebo niile, na ndịisi ezinaụlọ niile, ka ha bịakwute eze na , maka i site na ọn bụ obodo bugota igbe ọgbụgba ndụ anyị. Ndị niile gbakọtara bịakwute eze ọn nʼoge a na-eme mmemme nʼọnwa nke bụ ọnwa asaa nʼafọ. Mgbe ndị okenye niile bịarutere, ndị nchụaja buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja na ndị ị buliri ha elu. Eze ọn na ọgbakọ niile, bụ ndị zukọtara nʼebe ọ nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba. Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime ị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku ahụ. ndị ahụ gbasara nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, zochie igbe ọgbụgba ndụ ahụ na okporo osisi ndị e ji ebu ya. Okporo osisi ndị a dị oke ogologo, na e nwere ike ị site nʼ Nsọ, dị nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ hụ isi ha anya, ma onye na-anọghị nʼ Nsọ ahụ adịghị ahụ ha. Ha ka dịkwa nʼebe ahụ ruo taa. O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ tinyere nʼime ya nʼugwu , nʼebe anyị na ụmụ gbara ndụ, mgbe ha si nʼala pụta. Mgbe ndị nchụaja si nʼ Nsọ ahụ pụta, igwe ojii jupụtara ụlọnsọ ukwu anyị ahụ. Ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube anyị jupụtara nʼime ụlọnsọ ya. Mgbe ahụ, Solomọn sịrị, “Onyenwe anyị ekwuola na ọ ga-ebi nʼoke igwe ojii. Ma nʼezie, ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.” Dịka ọgbakọ niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha. Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Otuto dịrị anyị, bụ , onye ji aka ya mezuo nkwa nke o sitere nʼọnụ ya kwee nna m . Nʼihi na o kwuru sị, ‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke , ka e wuru m ụlọnsọ ka m dịrị nʼebe ahụ. Ma a họrọla m ị bụ onye ga-achị ndị m .’ “Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye anyị, bụ nke . Ma anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye m. Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, kama ọ bụ nwa gị nwoke, anụ ahụ gị na ọbara gị; ọ bụ ya ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye m.’ “Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna m , ugbu a, ana m anọdụ nʼocheeze nke dịka anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye anyị, bụ nke . Edoziekwala m ọnọdụ ebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ ga-adị, nʼime ya ka ọgbụgba ndụ anyị dị, bụ nke ya na nna nna anyị ha gbara, mgbe o mere ka ha si nʼala pụta.” Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ niile, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu, kwuo sị, “Onyenwe anyị, Chineke nke , ọ dịghị dịka gị nʼeluigwe nke dị nʼelu, maọbụ nʼụwa, nʼokpuru eluigwe. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị. I mezuokwala nkwa niile i kwere nna m , bụ ohu gị. I ji ọnụ gị kwee nkwa a ma taa, i jirila aka gị mezuo ya. “Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke , mezukwaa nkwa niile i kwere nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ nʼụzọ kwesiri ntụkwasị obi nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu m nʼocheeze nʼime ha.’ Ma ugbu a, Chineke nke , ka okwu gị, bụ nkwa nke i kwere ohu gị, bụ nna m , bịa na mmezu. “Ma ọ bụ ezie na gị ga-ebi nʼelu ụwa? Lee, eluigwe ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị? Ma anyị m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị taa. Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, abalị na ehihie, bụ ebe a i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị nʼebe ahụ,’ ka i si otu a nụrụ ekpere nke ohu gị ga-ekpe banyere ebe a. Nụrụkwa arịrịọ ohu gị na nke ndị gị niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa. “Mgbe onye ọbụla mehiere mmadụ ibe ya, a kpọọ ya oku ka ọ bịa ṅụọ iyi, onye dị otu a bịa, guzo nʼebe a, nʼihu ebe ịchụ aja gị a, ṅụọ iyi ahụ. Mgbe ahụ, nụrụ olu ya nʼeluigwe ma mee ihe ziri ezi. Kpeekwa ikpe nʼetiti ndị ohu gị, maa onye mejọrọ ikpe site nʼịtụkwasị nʼisi ha ihe o metara, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya, site nʼimeso ha dịka ezi omume ha si dị. “Mgbe ndị iro meriri ndị gị , nʼihi na ha mehiere megide gị, ọ bụrụ na ha alọghachikwute gị, too aha gị, na-ekpe ekpere, na-arịọ gị arịrịọ nʼụlọnsọ ukwu a, biko, site nʼeluigwe nụrụ ekpere ha, gbaghara mmehie ndị gị . Meekwa ka ha lọghachita nʼala ahụ nke i nyere nna nna ha. “Mgbe e gbochiri eluigwe, mee na mmiri adịghị ezokwa, nʼihi na ndị gị emehiela megide gị, ọ bụrụ na ha echee ihu nʼebe a kpee ekpere, too aha gị, si na mmehie ha chegharịa, nʼihi na ịtaala ha ahụhụ. Biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, bụ ndị gị . Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha. “Mgbe ụnwụ maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe ga-adakwasị ala a, maọbụ ọrịa na-eripịa ihe ubi maọbụ ọmụma ebu, maọbụ igurube maọbụ ụkpana, maọbụ mgbe onye iro nọchibidoro ha nʼobodo ha niile, ihe mbibi niile maọbụ ọrịa ọbụla, ekpere ọbụla maọbụ arịrịọ nke onye ọbụla nʼetiti ndị gị kpere ma rịọọ, nʼihi ịghọta ihe otiti niile nke obi ha, ha gbasapụ aka ha, ma chee ihu ha nʼebe ụlọnsọ ukwu dị, mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile, nʼihi na naanị gị maara obi mmadụ ọbụla, ka ha tụọ egwu gị oge niile nke ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha. “Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị , kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi gị, nʼihi na ha ga-anụ ihe banyere aha ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a, mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ na-eme, ka ha matakwa na-akpọkwasịrị gị nʼụlọ a nke m wuru. “Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye gị, kpee ekpere nye anyị, mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ (dịnyekwara ha). “Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro ha, ndị dọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso; ọ bụrụ na ha anọrọ nʼala ahụ a dọkpụrụ ha gaa, chegharịa nʼobi ha, nọrọ nʼala ebe ahụ eji ha rịọọ gị, sị, ‘Anyị emehiela, anyị emeela ihe nʼadịghị mma, anyị emekwala ajọ omume’; ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndị iro ha, bụ ndị dọọrọ ha nʼagha, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye gị; mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha, nyekwara ha aka. Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị, gbaghara njehie niile ha mere megide gị, ma meekwa ka ndị dọtara ha nʼagha gosi ha obi ebere. Nʼihi na ha bụ ndị gị na oke gị, ndị i mere ka ha si nʼala pụta, ala oke ịta ahụhụ nke nhụju anya. “Ka anya gị ghere oghe nʼarịrịọ mụ bụ ohu gị, nakwa nʼarịrịọ ndị gị , biko, na-egekwa ha ntị mgbe ọbụla ha bekuru gị akwa. Nʼihi na gị onwe gị kewapụtara ha site na mba niile nke ụwa ka ha bụụrụ gị ihe nketa, dịka ị kwupụtara site nʼọnụ ohu gị bụ , mgbe gị bụ kachasị ihe niile elu, bụ anyị mere ka nna nna anyị ha si nʼala pụta.” Mgbe ọn kpechara ekpere ndị a ya na arịrịọ ọ rịọrọ anyị o si nʼihu ebe ịchụ aja anyị, bụ ebe o gburu ikpere nʼala, bilie, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu. O guzoro gọzie ọgbakọ niile, gwa ha okwu nʼoke olu sị ha, “Onye a gọziri agọzi ka anyị bụ, onye nyere ndị ya, Izrel izuike dịka o kwere na nkwa. Ọ dịkwaghị okwu ọbụla nke na-emezughị nʼime ezi nkwa ahụ niile o kwere site nʼọnụ ohu ya. Ka anyị anyị dịnyere anyị, dịka o si dịnyere nna nna anyị ha. Ka ọ gharakwa ịhapụ anyị, maọbụ gbakụta anyị azụ. Ya nyekwa anyị mmụọ ime ihe niile ọ chọrọ, dịka uche nsọ ya si dị, na mmụọ ijezi ije nʼụzọ ya niile, na idebe ụkpụrụ na iwu niile nke o nyere nna nna anyị ha. Ka okwu m ndị a niile, nke m ji rịọ amara nʼihu anyị dịkwa anyị anyị nso ehihie na abalị. Ka o nyekwara ohu ya na ndị niile aka, dịka mkpa ụbọchị ọbụla si dị. Ka ndị niile bi nʼụwa mara na anyị bụ , marakwa na o nweghị chi ọzọ dị karịa ya. Ya mere, werenụ obi unu nyechasịa anyị bụ anyị, kpamkpam, na-ebinụ ndụ nʼụkpụrụ ya, rubenụ isi nʼiwu ya, dịka ọ dị taa.” Mgbe ahụ, eze ya na ndị niile chụrụ aja dị iche iche nʼihu anyị. Solomọn chụrụ aja udo, bụ nke ọ chụrụ nye anyị. Ehi dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri puku abụọ. Ya mere, eze na ndị niile si otu a doo ụlọnsọ anyị nsọ. Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, eze doro etiti ogige dị nʼihu ụlọnsọ anyị ahụ nsọ. Nʼebe ahụ ka ọ nọ chụọ aja nsure ọkụ, aja onyinye mkpụrụ ọka na aja abụba udo. O mere nke a nʼihi na ebe ịchụ aja bronz nke na-eguzo nʼihu dị oke nta ịbata aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka niile nakwa aja abụba udo niile ahụ. Ya mere, Solomọn ya na ndị niile mere mmemme a nʼoge ahụ, ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na ruo na mmiri iyi . Ha mere mmemme a nʼihu anyị anyị, ụbọchị asaa tinyere ụbọchị asaa ọzọkwa, ya bụ agụkọta ha ụbọchị iri na anọ. Nʼụbọchị nke na-eso ya, o zilagara ndị ahụ niile. Ha gọziri eze, laakwa nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke anyị meere ohu ya , na ndị ya .
Every verse in 1 Kings 8
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.