1 Samuel

1 Samuel 11

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

1 Samuel 11 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼoge ahụ, Nahash, eze ndị Amọn, duuru ndị agha ya bilie imegide ndị bi nʼala . Ma ndị rịọrọ ya sị, “Ka anyị na gị gbaa ndụ, anyị ga-anọ nʼokpuru ọchịchị gị.” Ma , onye Amọn zara sị ha, “Mụ na unu ga-agba ndụ ma ọ bụrụ na unu ekwenye ka m ghụpụta anya aka nri nke onye ọbụla nʼime unu, si otu a wetara niile ihe nkọcha.” Ndị okenye obodo zara sị, “Nye anyị abalị asaa ka anyị ziga ndị ozi nʼala niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye kwere ịbịa zọpụta anyị, anyị ga-ewere onwe anyị nyefee gị nʼaka.” Mgbe ndị ozi ha zipụrụ bịaruru , nke bụ obodo Sọl, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị a, ha niile dapụrụ nʼakwa. Ma nʼoge a, Sọl si nʼubi na-alọta, soro ụmụ ehi ya nʼazụ, ọ jụrụ, “Ọ bụ gịnị na-eme onye ọbụla? Gịnị mere na ha ji ebe akwa?” Ha kọọrọ ya ihe banyere ozi e si zite. Mgbe Sọl nụrụ ozi a, Mmụọ nke bịakwasịrị ya nʼike, iwe wekwara ya nke ukwuu. Ọ kpụpụtara ehi abụọ bọkasịa ha, zipụ ndị ozi ka ha buru ha ga obodo niile dị nʼ. Ozi ha ga-ezi ndị obodo ọbụla bụ nke a. “Ọ bụ ihe e mere ehi ndị a ka a ga-eme ehi onye ọbụla jụrụ iso Sọl na jee ọgụ.” anyị mere ka egwu jide ndị niile. Nʼihi ya, ha niile bịakwutere Sọl dịka otu mmadụ. Mgbe Sọl kpọkọtara ha na , ọnụọgụgụ ndị ikom dị narị puku atọ, tinyekwara iri puku mmadụ atọ, ndị sitere na . Ha gwara ndị zitere ozi ahụ okwu sị ha, “Zienụ ndị ikom , ‘Echi, tupu anyanwụ achaa nʼuju ya, a ga-anapụta unu.’ ” ndị ozi a gara zie ndị ikom ozi a, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu. Ndị ikom ziri ozi gwa ndị Amọn sị ha, “Echi, anyị ga-enye unu onwe anyị, ka unu mee anyị ihe masịrị unu.” Ma nʼụtụtụ echi, Sọl na ndị agha ya bịaruru. O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, buso ụmụ Amọn agha na mberede nʼisi ụtụtụ. O gbugidere ha ụtụtụ niile ruo mgbe anyanwụ chara nʼuju ya, chụsasịa ndị fọdụrụ nʼime ha. Nke a mere na o nweghị ebe a ga-ahụ ka ndị agha Amọn abụọ nọkọtara. Ndị niile bịakwutere jụọ ya sị, “Olee ndị ahụ sị na Sọl agaghị abụ eze anyị? Kpọpụtara anyị ha ka anyị gbuo ha!” Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa, Onyenwe anyị anapụtala !” gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.” Ya mere, mmadụ niile gara . Na mmemme pụrụ iche, ha mere Sọl eze nʼihu anyị. Ha chụkwara aja udo nye anyị nʼebe ahụ. Ọṅụ jupụtakwara nʼobi Sọl na ndị niile.

Every verse in 1 Samuel 11

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00