1 Samuel 17:14

“Devid bụ ọdụdụ nwa. Ụmụnne ya ndị okenye atọ na-eso Sọl.”

1 Samuel 17:14 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 14 of 58 in 1 Samuel chapter 17 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 Samuel 17 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼoge a, ndị chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo nke dị na maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼ , nke dị nʼagbata na . Mgbe ahụ, Sọl na ndị niile zukọtara maa ụlọ ikwu nke ha na ndagwurugwu Ịla. Ha doro onwe ha nʼusoro agha izute ndị . Ndị doro onwe ha nʼelu ugwu nʼotu akụkụ, ma ndị dokwara onwe ha nʼelu ugwu nʼakụkụ nke ọzọ. Ndagwurugwu dịkwa nʼetiti ha. Mgbe ahụ, otu onye ọka agha aha ya bụ ịat, onye obodo , sitere nʼetiti ụlọ ikwu ndị pụta. Nwoke a toro ogologo nke ukwuu; ịdị ogologo ya ga-erukwa mita atọ. O kpu okpu agha e ji bronz kpụọ, ma yiri uwe agha nke ịdị arọ bronz e ji kpụọ ya ga-erukwa iri kilogram ise na asaa. O yikwa ihe agha o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ nke e ji bronz kpụọ, nyakwasịkwa nʼubu ya ùbe e ji bronz kpụọ. A kpụrụ ùbe ya ka ọ dịrị ka osisi e ji ekwe akwa, jiri igwe ịdị arọ ya ga-eru kilogram asaa kpụọ ọnụ ọnụ ùbe ahụ. Onye na-ebu ọta o ji ekpuchi obi ya nọkwa nʼihu ya. Golaịat guzoro kpọkuo ndị agha sị ha, “Gịnị mere unu ga-eji pụta guzo nʼusoro ibu agha. Ọ bụ na m abụghị onye ? Ọ bụkwa na unu onwe unu abụghị ndị ozi Sọl? Họpụtaranụ onwe unu otu nwoke, ka ọ bịakwute m. Ọ bụrụ na onye ahụ unu họpụtara etigbuo m, anyị ga-abụrụ unu ndị ohu, ma ọ bụrụkwanụ na m etigbuo ya, unu ga-abụrụ anyị ndị ohu!” Mgbe ahụ, onye ahụ sịrị, “Taa, ana m ama usuu ndị agha aka nʼihu! Kpọpụtaranụ m otu nwoke ka mụ na ya lụọ ọgụ.” Mgbe Sọl na ndị agha nụrụ ihe onye a kwuru, ha mara jijiji tụọkwa oke egwu. Ma bụ nwa , onye nke dị na . Jesi mụtara ndị ikom asatọ. Nʼoge nke Sọl, ọ ghọọla agadi nwoke. Atọ nʼime ụmụ ndị ikom , ndị bụ okenye, soro Sọl gaa agha. Aha ha bụ , ọkpara ya, Abinadab, nwa nke abụọ na , nwa nke atọ. Devid bụ ọdụdụ nwa. Ụmụnne ya ndị okenye atọ na-eso Sọl. Ma na-apụ jekwuru Sọl, ma na-alaghachikwa nʼụlọ ịzụ atụrụ nna ya na . Golaịat, onye na-abịaru nso ụtụtụ na uhuruchi, na-eguzo onwe ya otu a iri ụbọchị anọ. Otu ụbọchị, Jesi gwara okwu sị, “Bịa ka i wegara ụmụnne gị otu akpa ọka ndị a e ghere eghe. Chịrịkwa ogbe achịcha iri ndị a chịlara ha. Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi, ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.” Ha na Sọl na ndị ikom niile, nọ na ndagwurugwu Ịla, na-ebuso ndị agha. Devid biliri njem nʼisi ụtụtụ, hapụ igwe atụrụ ya nʼaka onye na-elekọta atụrụ, buru onyinye ndị ahụ gawa dịka nyere ya nʼiwu. Ọ bịarutere ụlọ ikwu ndị mgbe ha na-apụ nʼihu agha, ha na-etikwa mkpu agha. Ndị na ndị dokwara onwe ha nʼusoro izute onwe ha nʼagha, ndị agha megide ndị agha. Devid hapụrụ ihe ndị ahụ nʼaka onye na-elekọta akpa niile, gbara ọsọ gaa nʼusoro ndị agha jụọ ụmụnne ya banyere udo ha. Ma mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, onye mmeri nʼọgbọ agha, onye nke , Golaịat bụ aha ya, sitere nʼusoro ndị agha pụta, kwuokwa okwu niile ahụ dịka ọ na-ekwu na mbụ. Devid nụrụ ihe o kwuru. Mgbe ndị niile hụrụ nwoke a, ha gbara ọsọ pụọ nʼihu ya ma tụọkwa oke egwu. Ndị sịrị, “Unu hụrụ nwoke a na-eguzo onwe ya? Ọ bụ ka ọ kparịa nnọọ ndị ka o ji apụta? Eze kwere nkwa inye onye ọbụla ga-etigbu ya akụ nʼebe ọ bara ụba. Ọ ga-akpọnyekwa ya nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya, meekwa ka ndị ezinaụlọ onye ahụ gharakwa ịtụ ụtụ taks ọzọ nʼ!” Devid jụrụ ndị ikom nọ ya nso, “Gịnị ka a ga-emere nwoke ga-etigbu onye a, meekwa ka mkparị a ghara ịdịrị ọzọ? Onye ka onye a a na-ebighị ugwu bụ, na ọ ga-apụta na-akparị ndị agha dị ndụ?” Ha gwara ya otu ihe ahụ ha kwuru na mbụ sị ya na ọ bụ ihe ahụ ka a ga-emere onye gburu ya. Mgbe , nwanne nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.” Ma zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?” Devid chigharịkwara jekwuru onye ọzọ jụọkwa ya otu ajụjụ ahụ. Ọ natakwara otu ụdị ọsịsa ahụ. Nʼikpeazụ, mgbe a matara ihe bụ uche , e mere ka Sọl mara ihe banyere . Sọl zikwara ozi ka a kpọọ ya. Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.” Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.” Ma gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ, achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya. Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye a na-amaghị otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha dị ndụ! Onyenwe anyị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị , “Gaa, ka anyị nọnyere gị.” Mgbe ahụ, Sọl yinyere uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi. Devid fanyere mma agha nʼime uwe ahụ, malite ijegharị ije, nʼihi na ọ maghị otu e si eyi uwe ndị ahụ ejegharị. Ọ dịghị anya, o gwara Sọl okwu sị, “Agaghị m eyi uwe ndị a nʼihi na o doghị m ahụ.” Ya mere, Devid yipụrụ ha. Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye ahụ. Onye ahụ, na-abịa nso na-apụkwute , onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya. O lere anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara anya. Ọ sịrị , “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” ahụ ji aha chi niile ya bụọ ọnụ. Ọ sịrị, “Bịa nʼebe a ka m were anụ ahụ gị mere anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa niile ihe oriri!” Ma sịrị onye ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị. Taa ka anyị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na nọ nʼ. Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na anyị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke anyị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.” Mgbe onye ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya. Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala. Otu a ka si jiri ebe na nkume merie onye ahụ. O gburu onye ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya. Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe ịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya! Mgbe ndị hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ. Mgbe ahụ, ndị agha na tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama , na nʼọnụ ụzọ ama ọn. Ndị nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ nke gawara na ọn. Emesịa, ndị lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị , nke ha hapụrụ gbaa ọsọ. Devid buuru isi onye bulata na . Ma dobe ngwa agha onye ahụ nʼime ụlọ ikwu nke ya. Mgbe Sọl nọ na-ele anya ka ọ na-apụ izute onye ahụ, ọ sịrị , ọchịagha ya, “Abna, nwa onye ka nwokorobịa ahụ bụ?” zara sị, “Dịka i si adị ndụ, eze, amaghị m.” Eze zara sị, “Chọpụta onye mụrụ nwokorobịa a.” Mgbe si nʼigbu onye ahụ lọghachi, Abna duuru ya, dute ya nʼihu Sọl. Isi onye a dịkwa nʼaka . Sọl jụrụ ya sị, “Nwokorobịa, nwa onye ka ị bụ?” zara sị, “Abụ m nwa ohu gị nwoke onye .”

Every verse in 1 Samuel 17

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00