1 Samuel 19:15

“Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe Devid nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.””

1 Samuel 19:15 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 15 of 24 in 1 Samuel chapter 19 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 Samuel 19 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Sọl gwara ndị ohu ya na ọkpara ya, Jonatan, ka ha gbuo . Ma nʼihi na ihe banyere masịrị , ọ dọrọ ya aka na ntị, “Nna m Sọl na-achọ ohere igbu gị. Lezie anya chee ndụ gị nche, ụtụtụ echi, gaa nʼebe ị ga-ezo onwe gị nọdụ nʼebe ahụ. Mụ na nna m ga-eso bịa nʼakụkụ ọhịa ebe ahụ i zoro onwe gị. Aga m agwa ya okwu banyere gị. Ihe ọbụla m chọpụtara, aga m agwa gị.” Jonatan kwuru okwu ọma banyere nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu. Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye ahụ. Onyenwe anyị nyekwara ndị niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka , site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị ya?” Sọl ṅara ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.” Emesịa, Jonatan kpọrọ gwa ya ihe mere. Jonatan duuru gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ. Agha ọzọ dakwara. Nʼoge a, Devid duuru ndị agha ya pụọ ibuso ndị agha. O gburu ọtụtụ nʼime ha, chụọkwa ndị agha ọsọ. Ma mmụọ ọjọọ anyị zitere bịakwasịrị Sọl dịka ọ nọ nʼime ụlọ ya, ùbe ya dịkwa ya nʼaka. Mgbe na-akpọ nʼụbọ akwara, Sọl tụrụ ùbe ahụ ka ọ tugbuo nʼahụ aja, ma ọ gbapụrụ site nʼihu Sọl, ma ùbe ahụ manyere nʼaja ụlọ ahụ. Devid gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya nʼabalị ahụ. Sọl zipụrụ ndị agha ka ha chee ụlọ nche, gbuo ya mgbe ọ pụtara nʼụtụtụ. Ma nwunye gwara ya sị, “Ọ bụrụ na ị gbapụghị, zoo onwe gị nʼabalị a, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ nʼụtụtụ echi.” Ya mere, Mikal sitere na oghereikuku wetuo , ebe o si gbapụ. Emesịa, Mikal kwagharịrị ihe ndina , were ihe a kpụrụ akpụ tụkwasị nʼelu ya, werekwa akwa kpuchie ya, tinye ihe ajị ewu nʼebe isi ya. Mgbe ndị agha ahụ bịaruru ijide na ịkpụgara ya Sọl, Mikal gwara ha sị, “Ahụ esighị ya ike.” Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.” Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ. Sọl jụrụ sị, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, mee ka onye iro m gbalaga?” zara, “Ọ bụ ya sịrị m, ‘Hapụ m ka m pụọ, nʼihi gịnị ka m ga-eji gbuo gị?’ ” Mgbe gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru na , kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na gara biri na Naịọt. Ozi ruru Sọl ntị, “Devid nọ na Naịọt nʼime ,” ya mere, o zipụrụ ndị ikom ka ha gaa jide ya. Ma mgbe ha rutere, ha hụrụ otu ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa ka ọ na-eguzo nʼebe ahụ dịka onyeisi ha. Mmụọ nke bịakwasịrị ndị ozi Sọl ahụ, mee ka ha malitekwa ibu amụma. Mgbe Sọl nụrụ ihe mere, o zipụkwara ndị agha ọzọ, ma ha onwe ha bukwara amụma! Otu ihe ahụ mekwara ndị o zipụrụ nke ugboro atọ. Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa , ruo nʼolulu mmiri . Ọ jụrụ, “Ebee ka na nọ?” Ha sịrị, “Ha nọ na Naịọt nke .” Ya mere, Sọl gara Naịọt nke dị na . Ma Mmụọ nke bịakwasịrị ya, dịka ọ na-aga nʼụzọ ọ malitere ibu amụma tutu ruo mgbe ọ bịaruru Naịọt. O yipụrụ uwe ya buo amụma nʼihu . Ọ gba ọtọ dinara ala nʼebe ahụ ehihie ahụ, na abalị ahụ niile. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”

Every verse in 1 Samuel 19

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00