1 Samuel

1 Samuel 31

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

1 Samuel 31 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼoge a, ndị lụsoro ndị agha, ndị si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu . Ndị ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na . Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ nʼebe ọ dị ukwuu. Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya. Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, soro Sọl nwụọ. Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ, onye na-ebu ihe agha ya na ndị agha ya niile, nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. Mgbe ndị nọ nʼofe ọzọ nke ndagwurugwu, na ndị nọ nʼofe Jọ, hụrụ na ndị agha agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị bịakwara bichie nʼime ha. Nʼechi ya, mgbe ndị bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom atọ ka ha tọgbọ nʼugwu . Ha bipụrụ Sọl isi, yipụkwa ya ihe agha ya. Ha zipụkwara ndị ozi gara nʼala ndị niile ikwusa akụkọ ihe mere nʼụlọ arụsị ha nakwa nʼetiti ndị ha niile. Ha tinyere ihe agha Sọl nʼụlọ ọret, kpọgidekwa ozu ya nʼaja ụlọ mgbidi obodo -. Mgbe ndị obodo nụrụ ihe ndị mere Sọl, ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, gara njem ogologo abalị ahụ niile jeruo -. Ha sitere nʼelu mgbidi obodo - tọda ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom buru ha laa ebe ha nọ kpọọ ozu ha ọkụ. Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi dị na , buo ọnụ ụbọchị asaa.

Every verse in 1 Samuel 31

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00