1 Samuel 9:21
“Ma Sọl zara sị, “Ọ bụghị onye Benjamin ka m bụ, onye sitere nʼebo kachasị nta nʼIzrel; ọ bụghị agbụrụ m dịkarịsịrị nta nʼetiti agbụrụ niile ọzọ dị nʼebo Benjamin? Gịnị mere i ji agwa m ụdị okwu dị otu a?””
1 Samuel 9:21 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 21 of 27 in 1 Samuel chapter 9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
1 Samuel 9 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
E nwere otu nwoke si aha ya bụ nwa , nwa , nwa , nwa , onye , burukwa oke mmadụ a maa ama. O nwere nwa nwoke aha ya bụ Sọl, onye bụ okorobịa nọ nʼuju ya. O nweghị nwoke ọzọ e ji atụnyere ya nʼ niile. O toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi. Otu ụbọchị, ụfọdụ nʼime ịnyịnya ibu nna Sọl nwere kpafuru. Nʼihi ya, Kish kpọrọ Sọl gwa ya okwu sị, “Duru otu odibo ka gị na ya soro ga chọgharịa ịnyịnya ibu ndị a.” Ha chọrọ ịnyịnya ndị ahụ gaa nʼala ugwu ugwu , na nʼakụkụ , ma ha ahụghị ha. Ha chọkwara ha gaa nʼakụkụ , ma ha ahụghị ha nʼebe ahụ. Emesịa, ha chọrọ ịnyịnya ibu ndị ahụ gaa nʼala niile nke ndị , ma ha ahụghị ha ebe ọbụla. Nʼikpeazụ, mgbe ha chọọrọ ha rute nʼala , Sọl gwara onyeozi ahụ ya na ya so, sị, “Ka anyị laghachi, nʼihi na ọ bụrụ na nna m elee anya anyị ma ọ hụghị anyị, ọ ga-amalite iche echiche banyere anyị karịa ịnyịnya ibu ndị a.” Ma odibo ahụ zara ya sị, “Lee, e nwere otu onye nke bi nʼobodo a; ọ bụkwa onye mmadụ niile na-asọpụrụ nʼihi na ihe ọbụla o kwuru na-emezu. Ka anyị gaa hụ ya, ma eleghị anya ọ ga-agwa anyị ụzọ anyị ga-esi.” Sọl sịrị odibo ya, “Ọ bụrụ na anyị agaa, gịnị ka anyị ga-enye nwoke ahụ? Nri dị na-akpa anyị agwụla, ọ dịkwaghị onyinye anyị nwere nke anyị ga-enye onye nke . Gịnị ka anyị nwere?” Onyeozi ahụ zara ya ọzọ sị, “Lee, enwere m otu mkpụrụ ọlaọcha. Aga m enye ya onye a ka ọ gwa anyị ụzọ anyị ga-esi.” (Na mgbe gara aga nʼ, ọ bụrụ na mmadụ agaa iju ase, ọ na-asị, “Bịa ka anyị jekwuru onye ọhụ ụzọ,” nʼihi na onye a na-akpọ onye amụma taa, ka a na-akpọ onye ọhụ ụzọ nʼoge ahụ). Sọl sịrị odibo ya, “Ọ dị mma, Bịa ka anyị gaa.” Ha biliri gawa nʼobodo ebe onye ahụ nọ. Mgbe ha na-arịgo ugwu ịbanye obodo ahụ, ha zutere ụfọdụ ụmụ agbọghọ ka ha na-apụta iseta mmiri, jụọ ha ajụjụ sị, “Onye ọhụ ụzọ ahụ ọ nọ nʼebe a?” Ụmụ agbọghọ ahụ zara ha sị, “E, ọ nọ ya. Lee ya ka ọ na-aga nʼihu unu. Unu jesie ike unu ga-ahụ ya. Ugbu a ka ọ batara obodo anyị, nʼihi na ọ na-aga iso ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼebe dị elu. Ngwangwa unu banye nʼobodo, unu ga-ahụ ya tupu o gaa nʼebe dị elu iri ihe. Nʼihi na ndị mmadụ agaghị ebido iri ihe tutu ruo mgbe o rutere, nʼihi na ọ ghaghị ịgọzi ihe aja ahụ tupu ndị a kpọrọ oku ebido iri ihe. Gbagoonụ unu ga-ahụ ya nʼoge dịka nke a.” Ya mere, ha mere ngwangwa, baa nʼime obodo ahụ. Dịka ha na-abata nʼime obodo, lee ka ọ na-abịakwute ha; ọ na-aga nʼebe ahụ dị elu. Ma nʼụbọchị bọrọ tupu ụbọchị Sọl na-abịa, Onyenwe anyị kpughere nke a nye . “Dịka mgbe a echi, aga m ezitere gị otu nwoke sị nʼala . Ị ga-ete ya mmanụ nke ga-eme ya ka ọ bụrụ onyendu ndị m. Ọ ga-azọpụta ha site nʼaka ndị , nʼihi na ahụla m ahụhụ nke ha nọ nʼime ya; anụkwala m ịkwa akwa ha.” Mgbe hụrụ Sọl, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Lee nwoke ahụ m gwara gị ihe banyere ya! Ọ bụ ya ga-achị ndị m.” Ma Sọl bịaruru nso jụọ ya sị, “Biko, zi m ebe ụlọ onye ọhụ ụzọ dị.” zara sị ya, “Mụ onwe m bụ ọhụ ụzọ ahụ. Gaanụ nʼihu m rigoruo nʼebe dị elu, nʼihi na mụ na unu ga-eso rikọọ nri taa. Nʼụtụtụ echi aga m agwa gị ihe dị gị nʼobi. Aga m ezilagakwa gị. Enyela obi gị nsogbu maka ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu nʼabalị atọ gara aga, nʼihi na a chọtala ha. Ma, onye ka mmadụ ahụ bụ, onye ndị niile na-achọsi ike? Ọ bụghị gị na ezinaụlọ nna gị.” Ma Sọl zara sị, “Ọ bụghị onye ka m bụ, onye sitere nʼebo kachasị nta nʼ; ọ bụghị agbụrụ m dịkarịsịrị nta nʼetiti agbụrụ niile ọzọ dị nʼebo ? Gịnị mere i ji agwa m ụdị okwu dị otu a?” Mgbe ahụ, duuru Sọl na onyeozi ya kpọbata ha nʼime ụlọ ukwu, nye ha ọnọdụ nʼisi oche nʼetiti iri mmadụ atọ ọ kpọrọ oriri. gwara onyeisi ndị na-esi nri okwu sị, “Weta anụ ahụ m nyere gị, nke ahụ m sị gị ka ị debe iche.” Onye na-esi nri weere ụkwụ anụ ahụ na ihe ndị so ya debe ya nʼihu Sọl. sịrị, “Lee, ihe ndị e wepụrụ ka e debere gị. Rie, nʼihi na e debere gị ya maka oge akara aka, site nʼoge ahụ m kwuru si, ‘Akpọrọ m ndị mmadụ oku nri.’ ” Sọl sooro rie nri nʼụbọchị ahụ. Mgbe ha sitere nʼebe ahụ dị elu rịdata nʼobodo. kpanyere Sọl ụka nʼelu ụlọ ya. Nʼisi ụtụtụ mgbe ha biliri, kpọrọ Sọl nʼụlọ elu sị, “Jikere, ka m zilaga gị.” Sọl kwadoro, ya na sooro pụọ nʼezi. Ka ha na-arịda na-abịaru nsọtụ obodo ahụ, sịrị Sọl, “Gwa onyeozi ahụ ka ọ gafee nʼihu anyị.” ahụ mekwara otu a, ma, “Gị onwe gị chere ntakịrị oge nʼebe a ka m mee ka ị nụrụ ozi sitere nʼaka .”
Every verse in 1 Samuel 9
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.