1 Timothy 4:5
“nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.”
1 Timothy 4:5 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 5 of 16 in 1 Timothy chapter 4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
1 Timothy 4 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ. Ozizi dị otu a na-esite nʼihu abụọ nke ndị ụgha, bụ ndị eji igwe ọkụ da nwụọ akọnuche ha. Ndị dị otu a na-egbochi ịlụ dị na nwunye na iri ihe oriri ụfọdụ. Ma ọ bụ kere ihe oriri ndị a ka ndị kwere ekwe, ndị maara eziokwu ahụ jiri ekpere na ekele nara ha. Ihe niile kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya, nʼihi na-esitere nʼokwu na ekpere doo ya nsọ. Ọ bụrụ na ị mee ka ụmụnna mara ihe ndị a, ị ga-abụ ezi onyeozi ịst ọs, onye a zụlitere nke ọma site nʼeziokwu nke okwukwe, na ezi ozizi nke ị gbasoro. Atụfula oge gị nʼịrụ ụka rụrụ arụ banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama zụọ onwe gị ka ị bụrụ onye nke na-asọpụrụ . Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu. Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na dị ndụ, onye bụ nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe. Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha. Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche. Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu . Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nʼibu amụma pụtara ihe mgbe ndị okenye bikwasịrị gị aka nʼisi. Jiri onyinye ndị a niile rụọ ọrụ, nọgidesie ike nʼọrụ gị, ka onye ọbụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma. Na-elezi anya na ndụ gị, na ozizi gị. Nọgidesie ike nʼihe ndị a nʼihi na site na ha, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.
Every verse in 1 Timothy 4
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.