2 Chronicles 3:9

“Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri shekel ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a.”

2 Chronicles 3:9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 9 of 17 in 2 Chronicles chapter 3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

2 Chronicles 3 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ahụ, Solomọn malitere iwu ụlọnsọ ukwu anyị. Ọ bụ nʼugwu Mọrịa, nke dị na , ka e wukwasịrị ya, nʼebe ahụ anyị mere ka bụ nna ya hụ ya anya. Ọ bụ nʼala ebe ịzọcha ọka , onye , ebe ahụ họpụtara. O bidoro iwu ụlọ ahụ nʼabalị nke abụọ, nke ọnwa abụọ, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị eze ya. Ntọala ọn tọrọ maka iwu ụlọnsọ dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara. (Nke a bụ ma ejiri ihe ọtụtụ ochie). Ịdị ogologo mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ dị mita itoolu, dịka ịdị ogologo obosara ụlọ nso ahụ nʼonwe ya. Ịdị elu ya dịkwa mita itoolu. O jikwa ọlaedo a nụchara anụcha machie ime ya. O ji osisi junipa machie ahụ ime ụlọ ezumezu ahụ, jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha techie osisi ndị ahụ niile. Emesịa, e sere oyiyi nkwụ dị iche iche, na oyiyi ụdọ igwe nʼahụ ụlọ ahụ iji chọọ ya mma. O ji nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche chọọ ime ụlọnsọ ahụ mma, ya na ọlaedo nke e si na bute. Ogidi osisi silin niile, na ibo ọnụ ụzọ niile, na aja ụlọ niile, na ọnụ ụzọ niile dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ ka o ji ọlaedo techie. Ọ gbukwara egbugbu oyiyi na mgbidi ya niile. O wuru ahụ ị Nsọ; nke ogologo ọnụ ụlọ ya dị mita iri, otu a kwa, obosara ya dị mita iri. O ji ọlaedo dị ezi mma nke ọnụahịa ya ruru narị talenti isii techie ahụ ime ụlọ ahụ niile. Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a. Solomọn tinyere oyiyi mmụọ ozi abụọ ọ kpụrụ nʼime ahụ ị Nsọ, werekwa ọlaedo machie ha. Ịdị ogologo nku ndị a ruru mita iri. Ịdị ogologo otu nku cherub nke mbụ ruru mita abụọ na ọkara. Ọnụ nku a na-emetụ ahụ ime ụlọ nke ụlọnsọ ukwu, ma ọnụ ọnụ nku nke ọzọ, nke ịdị ogologo ya ruru mita abụọ nʼọkara, na-emetụ ọnụ otu nku cherub nke ọzọ. Nʼotu aka ahụ, otu nku cherub nke abụọ ruru mita abụọ na ọkara nʼogologo. Ọnụ nku ya na-emetụ akụkụ nke ọzọ nke ahụ ime ụlọnsọ ukwu, ma nku ya nke ọzọ, nke rukwara mita abụọ na ọkara nʼogologo, na-emetụ ọnụ ọnụ otu nku cherub nke mbụ. Nku ndị a gbasapụrụ ruo mita iri nʼogologo. Ha guzo ọtọ nʼụkwụ ha, na-eche ihu nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ. O ji akwa na-acha anụnụ anụnụ, na uhie uhie, na odo odo, na ezi akwa ọcha, mee akwa mgbochi, nke a kpanyekwara oyiyi nʼime ya. O wuru ogidi abụọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nke ịdị elu ya ruru mita iri na asaa. Ọ kpụkwara ihe a dokwasịrị nʼelu ogidi ndị a, nke ịdị elu ha dị mita abụọ na ọkara. Ọ kpụkwara ihe yiri ụdọ igwe a tụrụ atụ, nke e kokwasịrị nʼelu ogidi abụọ ndị ahụ. Kpụọkwa narị mkpụrụ pomegranet, nke a ganyekọtara ya na ụdọ igwe ahụ. O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ, otu nʼakụkụ ugwu nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ , ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ .

Every verse in 2 Chronicles 3

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00