2 Kings 12:18

“Ma Joash, bụ eze Juda, chịkọtara ihe niile ahụ bụ nke Jehoshafat, Jehoram na Ahazaya nna ya, ndị bụ eze Juda doro nsọ nye Chineke, chịrịkwa onyinye nke ya onwe ya dokwara nsọ, na ọlaedo niile, na akụ niile e nwere ike ịchọta nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, zigara Hazael, bụ eze Aram. Nʼihi ihe ndị a, ọ lara, hapụ ibuso Jerusalem agha.”

2 Kings 12:18 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 18 of 21 in 2 Kings chapter 12 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

2 Kings 12 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼafọ nke asaa, nke ọchịchị nʼ, ka malitere ịbụ eze na . Iri afọ anọ ka ọ chịrị dịka eze na . Aha nne ya bụ ịa onye Bịasheba. mere ihe ziri ezi nʼanya anyị ụbọchị niile nke onye nchụaja ziri ya ihe. Ma naanị na o wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị nọgidere na-achụ aja dị iche iche nʼebe ahụ, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. sịrị ndị nchụaja, “Nakọtaanụ ego niile a na-ewebata dịka onyinye dị nsọ nʼụlọnsọ ukwu anyị, ya bụ, ego a na-anakọta nʼoge ịgụ mmadụ ọnụ, na ego e webatara maka imezu nkwa ndị mmadụ kwere, na ego e webatara nʼụlọnsọ ukwu dịka onyinye afọ ofufe. Ka onye nchụaja ọbụla site nʼaka otu nʼime ndị na-eche ego nara ego, a ga-eji mezie ihe ọbụla a chọpụtara na o mebiri nʼụlọnsọ ukwu ahụ.” Ma nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze , ọ chọpụtara na ndị nchụaja ahụ emezibeghị ihe mebiri nʼụlọnsọ. Ya mere, eze kpọrọ , onye nchụaja, kpọkwaa ndị nchụaja ndị ọzọ jụọ ha, “Gịnị mere unu emezibeghị ụlọnsọ a? Site ugbu a gaa nʼihu, unu esitekwala nʼaka ndị na-eche ego anara ego ọzọ, kama, nyefeenụ ya maka iji dozie ụlọnsọ ukwu ahụ.” Ndị nchụaja ahụ kwenyere sị, “Anyị agaghị esitekwa nʼaka ndị mmadụ nara ego ọbụla. Otu a kwa, anyị agaghị emezikwa ụlọnsọ ukwu a nʼonwe anyị.” Mgbe ahụ, Jehoiada wetara otu igbe mepuo oghere nʼelu ya, debe ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼaka nri dịka mmadụ na-abata nʼụlọnsọ ukwu anyị. Ndị nchụaja niile na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ na-etinye ego niile e webatara nʼụlọnsọ anyị nʼime igbe ahụ. Mgbe ọbụla ha hụrụ na igbe ego ahụ ejupụtala nʼego, onye ode akwụkwọ ụlọeze na onyeisi nchụaja na-abịa, gụọ ego ahụ e webatara nʼụlọnsọ anyị, tinye ha nʼakpa. Ha na-ewere ego ahụ a gụrụ ọnụ, nyefee nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ndị ọrụ na-emezi ụlọ anyị. Ndị ahụ na-eji ya kwụọ ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-ewu ụlọ, na ndị na-edo nkume, na ndị na-awa nkume ụgwọ. Ọ bụ sitekwa nʼego ahụ ka a na-azụta osisi na nkume a wara awa iji dozie ụlọnsọ anyị, na ịkwụ ụgwọ ihe ndị ọzọ e ji emezi ihe niile ekwesiri imezi nʼụlọnsọ ukwu ahụ. E jikwaghị ego ahụ e webatara nʼụlọnsọ kpụta efere ọlaọcha, ihe e ji akpakepụ ọkụ, efere ịkwọsa mmiri, opi maọbụ ihe ndị ọzọ nke e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha kpụọ maka ụlọnsọ ukwu nke anyị. Ọ bụ ndị na-eje ozi, ndị ji ya rụzie ụlọnsọ ukwu anyị ka e nyere ya. O nweghị onye a sịrị ka ọ gụzie otu e si jiri ego ahụ rụọ ọrụ, bụ ndị e nyere ego ahụ maka ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ, nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. E webataghị ego niile sitere nʼaja ikpe ọmụma nakwa aja mmehie nʼime ụlọnsọ ukwuu anyị. Ọ bụ ndị nchụaja nwe nke ahụ. Nʼoge ahụ, Hazael eze , gara buso agha, lụgbuo ya, dọta ya nʼagha. Emesịa, o chere ihu nʼụzọ imegide ya. Ma , bụ eze , chịkọtara ihe niile ahụ bụ nke , Jehoram na nna ya, ndị bụ eze doro nsọ nye , chịrịkwa onyinye nke ya onwe ya dokwara nsọ, na ọlaedo niile, na akụ niile e nwere ike ịchọta nʼụlọnsọ anyị, na nke dị nʼụlọeze, zigara , bụ eze . Nʼihi ihe ndị a, ọ lara, hapụ ibuso agha. Akụkọ gbasara ọchịchị eze , na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze niile mere nʼoge ha. Ndị ozi ya gbara izu ọjọọ megide , gbukwaa ya na , nʼụzọ e si aga . Ndịisi ozi ahụ gburu ya bụ nwa , na nwa . Ọ nwụrụ, e lie ya na ndị nna nna ya ha nʼobodo . Amazaya nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Every verse in 2 Kings 12

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00