2 Kings 21:6
“O jikwa nwa ya nwoke chụọ aja nʼime ọkụ, ọ gbara aja, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.”
2 Kings 21:6 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 6 of 26 in 2 Kings chapter 21 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
2 Kings 21 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Manase gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ ise na ise na . Aha nne ya bụ . O mere ihe dị njọ nʼanya anyị, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị anyị chụpụrụ nʼihu ndị . O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya lara nʼiyi. O wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nye , pịakwa ogidi , dịka eze mere. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe, feekwa ha ofufe. O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ anyị, nke anyị, kwuru okwu banyere ya sị, “Ọ bụ na ka m ga-etinye m.” O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe, nʼogige abụọ nke nʼụlọnsọ anyị. O jikwa nwa ya nwoke chụọ aja nʼime ọkụ, ọ gbara aja, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya anyị, si otu a kpasuo ya iwe. O were chi a pịrị apị, bụ nke o mere, debe nʼime ụlọnsọ ahụ, nke anyị gwara na nwa ya ọn okwu, sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime , nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke , ka m ga-akpọkwasị m ruo mgbe ebighị ebi. Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị wagharịa ọzọ site nʼala ahụ nke m nyere ndị nna nna ha, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu ma debekwa iwu niile nke ohu m bụ nyere ha.” Ma ha egeghị ntị, Manase duhiere ha, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị . Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị, “Nʼihi na , eze emeela ihe arụ ndị a, o meela ihe dị njọ karịa nke ndị Amọrait, bụ ndị bụ ya ụzọ, o werela arụsị ya duba nʼime mmehie. Ya mere, nke a bụ ihe anyị, bụ nke , sịrị: Lee, ana m aga iweta mbibi dị ukwuu nke ga-adakwasị na , nke ntị ọbụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru. Aga m esetipụ eriri ịtụ ọtụtụ nke m ji megide na ihe ịtụ mgbidi nke m ji megide ụlọ , nʼelu . Aga m ehichapụ dịka mmadụ si ehichapụ efere, hichaa ya ihu na azụ ma kpuo ya ihu nʼala. Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile, nʼihi na ha emeela ihe dị njọ nʼanya m, kpasukwaa m iwe, site nʼụbọchị nna nna ha si pụta ọbụladị ruo taa.” Nke ka nke, Manase gbukwara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha, ruo na ọ wụsaara ọbara ha site nʼotu akụkụ ruo nʼakụkụ nke ọzọ ya, nke a agụnyeghị mmehie ahụ nke o dubara ndị ime, nke mere ka ha mee ihe dị njọ nʼanya anyị. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị na ihe niile o mere, tinyere mmehie niile nke o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze ? Manase soro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼime ubi a gbara ogige nʼụlọeze ya, bụ ubi Ụza a gbara ogige. Amọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na . Aha nne ya bụ , ada onye . O mere ihe dị njọ nʼanya anyị dịka nna ya mere. Ọ gbasoro ụzọ ahụ niile dị iche nke nna ya gbasoro. O fere arụsị niile nke nna ya fere, kpọọkwa isiala nye ha. Ọ jụrụ iso anyị, bụ nna nna ya ha, jụkwa ibi ndụ irube isi nye ya. Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu eze nʼime ụlọeze ya. Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amọn na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze ? E liri ya nʼili nke aka ya, dị nʼogige Ụza. Josaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Every verse in 2 Kings 21
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.