2 Samuel 18:33

“Okwu a metụrụ eze nʼahụ nke ukwuu, o biliri rigoo nʼụlọ nke dị nʼọnụ ụzọ ama, nọdụ nʼebe ahụ kwaa akwa. Ọ nọ na-akwa akwa mgbe ọ na-aga, na-eti mkpu akwa na-asị, “O, nwa m, Absalọm! O nwa m, nwa m, Absalọm. A sịkwarị na m nwụrụ nʼọnọdụ gị! O, Absalọm nwa m, nwa m oo!””

2 Samuel 18:33 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 33 of 33 in 2 Samuel chapter 18 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

2 Samuel 18 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Devid gụkọtara ndị ya na ha so ma họpụta ndịisi agha. Doo ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ puku ndị agha, ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ narị ndị agha. Devid zipụrụ ndị agha ya, otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nʼokpuru , Ọ họpụtakwara , nwanne , nwa , ka ọ chịa otu ụzọ. Ma otu ụzọ nke fọdụrụ ka o tinyere nʼaka onye . Eze gwara ndị agha ahụ sị, “Mụ onwe m ga-edu unu gaa agha.” Ma ndị ikom ahụ sịrị, “Ị gaghị apụkwa ọzọ nʼihi na ọ bụrụ na anyị atụgharịa bido ịgba ọsọ, ọ bụrụkwa na otu ọkara nʼime anyị anwụọ, nke ahụ agaghị emetụ ha nʼobi. Naanị gị ka ha na-achọ. Ị dịkwa mkpa karịa puku ndị agha iri. Ọ ga-akara anyị mma ugbu a ka ị na-ezitere anyị inyeaka site nʼime obodo.” Eze zara nʼikpeazụ sị, “Ihe ọbụla dị mma nʼanya unu ka m ga-eme.” Ya mere, eze guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dịka ndị ikom ya niile na-apụ nʼusu nke ọtụtụ narị, nakwa nʼusu nke ọtụtụ puku. Eze nyere ndịisi agha ya, bụ , Abishai na , iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ ọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere ọm. Ndị agha si nʼobodo pụọ izute ndị nʼagha. Alụrụ agha a nʼọhịa . Ndị agha tigbukwara ndị agha . Ha gburu iri puku ndị agha abụọ nʼụbọchị ahụ. Agha ahụ gbasara nʼelu ala ahụ niile. Ndị nwụrụ nʼọhịa nʼetiti ụmụ karịrị ndị e gburu egbu. Absalọm zutere ndị agha . Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga. Otu nʼime ndị ikom ahụ hụrụ ya, kọọrọ , “Lee, ahụrụ m ọm ebe ọ kwụ nʼelu osisi ook.” sịrị nwoke ahụ onye gwara gị, “Gịnị, ị hụrụ ya? Gịnị mere i tigbughị ya ka o ruo nʼala nʼebe ahụ? Mgbe ahụ, agaara m enye gị ọlaọcha iri, na belịt a na-enye onye bụ dike nʼagha.” Ma nwoke ahụ zara sị, “A sịkwarị na e nyere m puku ọlaọcha nʼaka m a, agaraghị m egbu ya. Nʼihi na anyị niile nụrụ mgbe eze na-agwa gị na na sị, ‘Lezienụ anya banyere nwokorobịa bụ ọm, nʼihi m.’ A sị na m gburu ya, ọ ga-abụ imegide eze. Ọ ga-emesiekwa chọpụta onye mere ya. Ma gị onwe gị agaraghị apụta kwuchite ọnụ m.” sịrị, “Ọ bụghị otu a ka m ga na-eche nʼihu gị.” Ya mere, ọ chịịrị ùbe atọ nʼaka ya, dubaa ha nʼobi ọm, mgbe ọm ka dị ndụ makwụrụ nʼelu osisi ook. Ụmụ okorobịa iri ndị na-ebu ihe agha gbara ọm gburugburu, tigbuo ya. Emesịa, fụrụ opi ike nke mere ka ndị agha na-achụ ndị kwụsị ịchụ ha ọsọ, nʼihi na kwụsịrị ha. Ha buuru ozu ọm tụba ya nʼolulu ukwu dị nʼoke ọhịa ahụ, werekwa nkume tụọ ya nʼelu. Ndị agha niile gbalara nʼụlọ ha. Nʼoge ọm dị ndụ, o wuuru onwe ya ogidi ncheta. O wuru ogidi a na , nʼihi na o chere nʼime onwe ya sị, “Enweghị m nwa nwoke ga-aza aha m.” Ya mere, ọ gụrụ ogidi ahụ aha nke ya onwe ya. Ọ bụkwa ọm ka a na-akpọ ya ruo taa. Mgbe ahụ, Ahimaaz, nwa ọk, bịakwutere sị ya, “Biko, ka m gbara ọsọ gaa zie eze oziọma a, na anyị azọpụtala ya site nʼaka ndị iro ya.” Ma zara sị ya, “Ọ bụghị gị ga-ezi eze ozi taa. I nwere ike ime ya mgbe ọzọ, ma ọ bụghị taa, nʼihi na nwa eze nwụrụ.” gwara otu nwoke onye sị ya, “Gaa gwa eze ihe ị hụrụ.” ahụ kpọrọ isiala, gbapụ ọsọ. Ahimaaz nwa ọk rịọkwara ọzọ sị ya, “Otu ọbụla o si dị, biko kwere ka m gbaso onye a.” Ma zara sị, “Nwa m nwoke, gịnị mere i ji chọọ ị ga? I nweghị ozi ọbụla ị ga-ezi nke ga-ewetara gị ụgwọ ọrụ.” Ọ rịọrọ sị, “Otu ọbụla o si dị, hapụ m ka m gaa.” Nʼikpeazụ kwenyere sị ya, “Ọ dị mma, gbara ọsọ gaa.” sitere nʼụzọ dị mkpụmkpụ nke gafere obosara ala Jọ buru nwoke ahụ ụzọ gbaruo. Devid nọ nʼọnụ ụzọ ama nʼoge a. Mgbe onye nche rigoruru nʼelu mgbidi ebe ọ na-anọ, ọ hụrụ otu nwoke ka ọ na-agba ọsọ naanị ya. Onye nche ahụ kpọrọ oku gwa ya na o nwere onye na-abịa. Ma eze zara ya sị, “Ọ bụrụ naanị ya, o nwere oziọma.” onyeozi ahụ na-abịaru nso, onye nche ahụ lepụkwara anya hụ otu nwoke ọzọ ka o ji ọsọ na-abịa naanị ya. Ọ kpọkwara oku ọzọ sị, “Onye ọzọ na-abịakwa.” zara sị, “Onye ahụ ga-enwekwa oziọma.” Onye nche ahụ zara sị, “Onye nke mbụ na-abịa dị ka , nwa ọk,” zara sị, “Ọ bụ ezi mmadụ, ọ bụkwa oziọma ka o ji na-abịa.” Mgbe ahụ, Ahimaaz kpọrọ eze oku sị, “Udo!” Ọ kpọrọ isiala nye eze. Kpuokwa ihu ya nʼala sị, “Ngọzị na-adịrị anyị gị. Onye nke mebiri nzube ndị ahụ niile weliri aka imegide onyenwe m bụ eze.” Eze jụrụ ya sị, “Oleekwanụ maka nwokorobịa ahụ bụ ọm? Ọ nọkwa nʼudo?” zara sị, “Mgbe zipụrụ ohu eze, na mụ onwe m, oke ụzụ dị, ma amaghị m ihe kpatara ya.” Eze gwara ya sị, “Chere nʼebe a.” chigharịrị chere. Mgbe ahụ, onye ahụ bịarutere sị, “Onyenwe m bụ eze, nụrụ oziọma a. Taa anyị ekpepụtala gị site nʼịnapụta gị nʼaka ndị niile biliri imegide gị.” Eze jụrụ onye ahụ, “Nwokorobịa ahụ bụ ọm, ọ nọkwa nʼudo?” ahụ zaghachiri, “Ka ndị iro onyenwe m bụ eze na ndị niile na-ebili imejọ gị dị ka nwokorobịa ahụ!” Okwu a metụrụ eze nʼahụ nke ukwuu, o biliri rigoo nʼụlọ nke dị nʼọnụ ụzọ ama, nọdụ nʼebe ahụ kwaa akwa. Ọ nọ na-akwa akwa mgbe ọ na-aga, na-eti mkpu akwa na-asị, “O, nwa m, Absalọm! O nwa m, nwa m, Absalọm. A sịkwarị na m nwụrụ nʼọnọdụ gị! O, Absalọm nwa m, nwa m oo!”

Every verse in 2 Samuel 18

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00