2 Samuel 19:7
“Ugbu a, pụọ gaa kelee ndị agha gị. Eji m aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụrụ na ị pụghị nʼezi kelee ha, otu onye nʼime ha agaghị afọdụ nʼebe a mgbe chi taa jiri, mgbe ahụ ihe ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe niile i jirila anya gị hụ na ndụ gị.””
2 Samuel 19:7 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 7 of 43 in 2 Samuel chapter 19 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
2 Samuel 19 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ọ dịghị anya ozi ruru ntị sị, “Lee, eze na-akwa akwa, na-eru ụjụ nʼihi ọm.” Mgbe ndị agha ya nụrụ na eze nọ nʼoke iru ụjụ nʼihi nwa ya, mmeri ha ghọọrọ ha ihu mgbarụ nʼụbọchị ahụ. Ndị agha niile zobatasịrị onwe ha nʼime obodo dịka a ga-asị na ha bụ ndị ihere na-eme dịka ndị e meriri nʼagha. Eze kpuchiri ihu ya nọgidekwa na-akwa akwa na-asị, “O, nwa m ọm! O! Absalọm nwa m, nwa m!” Emesịa, jekwuuru eze nʼụlọ sị ya, “Anyị zọpụtara ndụ gị, na ndụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, na ndị nwunye gị, na ndị iko gị nwanyị taa, ma lee ka ị si emeso anyị. Ị na-eme ka ihere mee anyị, dịka a ga-asị na anyị mere ihe ọjọọ. Ị hụrụ ndị iro gị nʼanya, ma na-akpọ ndị hụrụ gị nʼanya asị. I meela ya ka ọ pụta ìhè taa na o nweghị ihe ndị ọchịagha gị na ndị agha gị bụ nʼanya gị. Ahụrụ m na ọ gaara abụ ihe ziri ezi nʼanya gị ma a sịkwarị na ọm dị ndụ taa, ma anyị niile anwụọ. Ugbu a, pụọ gaa kelee ndị agha gị. Eji m aha anyị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụrụ na ị pụghị nʼezi kelee ha, otu onye nʼime ha agaghị afọdụ nʼebe a mgbe chi taa jiri, mgbe ahụ ihe ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe niile i jirila anya gị hụ na ndụ gị.” Ya mere, eze biliri nọdụ ọdụ nʼọnụ ụzọ ama. Mgbe ndị agha nụrụ na eze nọ nʼọnụ ụzọ ama, ha niile pụtara guzo nʼihu ya. Ma nʼoge a, ndị niile agbalaala, onye ọbụla nʼụlọ ya. Nʼetiti ebo niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị . Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi ọm.” Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịa anyị anwụọla nʼagha. Gịnị mere, unu a gaghị ekwu okwu i kpọghachite eze anyị? Eze zigaara ọk na Abịata, ndị nchụaja ozi a, “Jụọnụ ndị okenye sị, ‘Nʼihi gịnị ka unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ime ka eze lọghachi nʼobi ya, ebe ọ bụ na ihe a na-ekwu nʼala niile eruola eze ntị nʼebe o bi? Ụmụnne m ka unu bụ, ọkpụkpụ m na anụ ahụ m. Gịnị mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-akpọlata eze nʼụlọ ya?’ Gwakwanụ sị ya, ‘Ọ bụ na ị bụghị ọkpụkpụ m na anụ ahụ m? Ka mesoo m mmeso otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na ị bụghị ọchịagha m malite taa nʼọnọdụ .’ ” Amasa mere ka obi ndị okenye rulata, dịka otu mmadụ. Ha zigara eze ozi, sị, “Lọghachikwute anyị, gị na ndị ohu gị niile.” Mgbe ahụ, eze lọghachitere na Jọ. Ndị ikom bịarutere izute eze, na ịkpọfeta ya Jọ. Shimei, nwa , onye , nwoke ahụ sitere na , mere ngwangwa soro ndị ikom pụta izute eze . Ya na puku ndị ikom sokwa. Ziba, onyeozi Sọl, na ụmụ ya ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ ndị ozi ya, mekwara ngwangwa ịbịarute Jọ tupu eze erute nʼebe ahụ. Ha gabigara mmiri nʼebe ọ dị nta ịkwọfe ndị ụlọeze nʼụgbọ mmiri, na ime ihe ọbụla dị mma nʼanya ya. Mgbe nwa gafere Jọ, ọ dara nʼala nʼihu eze, sị ya, “Ka m, ghara ịgụkọrọ m njehie m nye m. Echetakwala otu ohu gị si mee ihe nʼezighị ezi nʼụbọchị onyenwe m hapụrụ pụọ. Ka eze ghara itinye ya nʼobi ya, nʼihi na mụ bụ ohu gị maara na m mehiere, ma taa abịara m dịka onye mbụ site nʼagbụrụ , ịbịa zute onyenwe m, bụ eze.” Abishai nwa jụrụ eze sị ya, “Ọ bụ na agaghị anwụ nʼihi ihe a? Nʼihi nkọcha ọ kọchara onye anyị tere mmanụ bụ eze.” Ma sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom , nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze ?” Ya mere eze gwara sị, “I gaghị anwụ. Eze jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa a.” Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ , ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo. Mgbe o si pụta izute eze, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Mefiboshet, gịnị mere i soghị m gaa?” Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, eze, agwara m ohu m ka o doziere m ịnyịnya ibu m, ka m soro eze, ma ebe m bụ onye ngwụrọ, ọ ghọgburu m. O kwuluru ohu gị nʼebe onyenwe m bụ eze nọ. Ma onyenwe m bụ eze dịka mmụọ ozi , nʼihi ya mee m ihe masịrị gị. Nʼagbanyeghị na ụlọ nna m niile dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe onyenwe m bụ eze nọ, ma i nyere ohu gị ọnọdụ nʼetiti ndị na-eri nri nʼelu tebul gị. Gịnị bụ ikike ọzọ m nwere iji rịọọ eze arịrịọ?” Eze sịrị ya, “Nʼihi gịnị ka ị ka na-ekwuru okwu? Enyela m gị na iwu ka unu kee ala ahụ nʼetiti onwe unu.” Mefiboshet sịrị eze, “Ka o were ihe niile ebe onyenwe m bụ eze lọghachiri nʼụlọ ya nʼudo.” Bazilai onye sikwa na bịa iso eze kwọfee osimiri Jọ, na izilaga ya site nʼebe ahụ. Nʼoge a, Bazilai bụ agadi nwoke, onye gbara iri afọ asatọ. Ọ lekọtara eze mgbe eze nọ na , nʼihi na ọ bụ ọgaranya. Eze gwara sị ya, “Soro m gafee osimiri ka i soro m biri na . Aga m elekọtakwa gị.” Ma zara eze sị ya, “Afọ ole ka ọ fọdụrụ m ịdị ndụ m ga-eji soro eze gaa ? Agbaala m iri afọ asatọ. Enwere m ike ịkọwa ihe dị iche nʼetiti ihe dị mma na nke na-adịghị mma. O nwere ụzọ ohu gị si anụ ụtọ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O nwere ụzọ m si anụ olu ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ? Gịnị mere ohu gị ga-eji buru ibu arọ nye onyenwe m na eze? Ohu gị ga-eso eze gafee osimiri Jọ, maọbụ nʼihi gịnị ka eze ga-eji nye m onyinye ọzọ dị iche. Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ , ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.” Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.” Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọ, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya. Mgbe eze gabigara ruo , Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha niile na otu ọkara ndị agha niile mere ka eze gabiga. Ọ dịghị anya, ndị ikom niile nọ na-abịakwute eze na-asị ya, “Gịnị mere ụmụnna anyị, ndị ikom , jiri zopu eze kpọfeta ya na ezinaụlọ na ndị ikom ya niile osimiri Jọ?” Ma ndị ikom zara ndị ikom , “Anyị mere nke a nʼihi na eze bụ onye metụtara ahụ anyị. Gịnị mere iwe ji ewe unu maka nke a? Anyị eriela ihe ọbụla site na nri eze? Ka anyị anarala ihe ọbụla dobere onwe anyị?” Ma ndị ikom zara sị, “Anyị dị ebo iri nʼ, nʼihi ya, anyị nwere oke iri nʼime karịa unu. Gịnị mere unu ji lelịa anyị anya? Chetakwanụ na ọ bụ anyị bu ụzọ kwuo okwu maka nlọta ya ịbụ eze anyị ọzọ.” Ma ndị ikom ejighị olu ọma nye ndị ọsịsa.
Every verse in 2 Samuel 19
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.