2 Timothy 3:16
“Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume:”
2 Timothy 3:16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 16 of 17 in 2 Timothy chapter 3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
2 Timothy 3 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ. Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha. Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ. Ndị na-arara ibe ha nye nʼaka ndị iro ha, ndị isiike, ndị onwe ha juru afọ; ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nʼanya, kama ịhụ nʼanya. Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ. Ụfọdụ nʼime ha bụ ndị na-abanye nʼime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nʼihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụobi ha agụụ. Ndị a na-akụziri ihe oge niile, ma ha apụghị inweta amamihe nke eziokwu. Dị ka na si lụso ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ha bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nʼebe okwukwe anyị dị. Ma ha agaghị aga nʼihu nʼihi na nzuzu ha ga-apụta ihe nʼihu mmadụ niile, dịka nke mmadụ abụọ ahụ. Ma ugbu a, ị maara ihe niile banyere ozizi m, na omume m, na ebumnuche m, na okwukwe m na ntachiobi m, na ịhụnanya m, na ndidi m, na mkpagbu m na ahụhụ niile nke dakwasịrị m nʼọk, na ọm, na . Ị maara ụdị mkpagbu dị iche iche m gabigara. Ma anyị napụtara m site nʼime ha niile. Nʼezie, ndị niile chọrọ ibi ndụ ịsọpụrụ nʼime ịst ọs ga-agabiga mkpagbu. Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie. Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nʼihe ịmụtara na ihe i kwenyesịrị ike na ya, ebe ị maara onye i si nʼaka ya mụta ha. Ị maara na ọ bụ site nʼoge ị bụ nwantakịrị ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri doo gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site nʼokwukwe i nwere nʼime ịst ọs. Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume: ka onye nke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla.
Every verse in 2 Timothy 3
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.