Acts 21:30
“Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile.”
Acts 21:30 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 30 of 40 in Acts chapter 21 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Acts 21 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe anyị hapụsịrị ha, anyị nyapụrụ ụgbọ anyị bịaruo . Nʼechi ya, anyị rutere . Anyị sitere nʼebe ahụ jeruo . Mgbe anyị hụrụ ụgbọ mmiri na-aga , anyị banyere nʼime ya kwọpụ. Mgbe anyị kwọruru ụgbọ anyị ebe anyị nwere ike ịhụ ọs, anyị siri nʼaka ekpe ya gafee, ruo . Anyị rutere nʼọnụ mmiri Taịa, ebe ụgbọ mmiri ga-akwapụ ibu dị nʼime ya. Mgbe anyị chọtara ndị na-eso ụzọ ahụ, anyị nọnyere ha abalị asaa. Ha gwara Pọl site nʼike nke Mmụọ Nsọ, ka ọ ghara ịga . Mgbe anyị nọzuru ụbọchị anyị, anyị hapụrụ ha, bilie ije. Ha na nwunye ha na ụmụ ha so dupu ruo mgbe anyị si nʼobodo ahụ pụọ. Anyị na ha gburu ikpere nʼala nʼọnụ mmiri kpee ekpere. Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha. Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na . Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị. Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute . Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ. O nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma. Mgbe anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, ka otu onye amụma a na-akpọ ọs, si ịa bata. Ọ bịakwutere anyị, chilite belịt Pọl na-eke nʼukwu, kee onwe ya nʼụkwụ na aka sị, “Dịka Mmụọ Nsọ kwuru, ‘otu a ka ndị ndu ndị ga-eke onye nwe ihe a agbụ na . Ha ga-ararakwa ya nye nʼaka ndị mba ọzọ.’ ” Mgbe anyị nụrụ nke a, anyị na ndị niile nọ nʼebe ahụ rịọrọ Pọl ka ọ ghara ịga . Ma Pọl zaghachiri, “Gịnị ka unu na-eme, ọ bụ akwa ka unu na-ebe, na-eme ka obi gbawaa m? Nʼihi na ọ bụghị naanị na m dị njikere ka e kee m agbụ, kama ejikekwara m iwere ndụ m nye na nʼihi aha anyị ọs.” Ebe ọ na-ekweghị ege anyị ntị, anyị kwụsịrị ma sị, “Ka e mee uche anyị.” Mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, anyị jikere bilie ịga . Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ ndị nọ na , duuru anyị gaa, ha kpọruru anyị nʼụlọ , onye ọs ebe anyị ga-anọ dịka ọbịa, onye sitere na mbụ bụrụ onye na-eso ụzọ ahụ. Mgbe anyị rutere , ndị ụmụnna jiri obi ụtọ nabata anyị. Nʼụbọchị nke so ya, anyị na Pọl gara ileta , ndị okenye niile nọkwa nʼebe ahụ. Mgbe o kelechara ha, ọ kọọrọ ha nʼotu nʼotu, ihe niile rụrụ nʼetiti ndị mba ọzọ site nʼije ozi ya. Mgbe ha nụchara nke a, ha nyere otuto. Emesịa, ha sịrị Pọl, “Leenụ nwanna, otu ọtụtụ puku ndị si bụrụ ndị kwere ekwe, ha niile ka ihe banyere iwu a na-anụ ọkụ nʼobi. A kọọrọla ha ihe banyere gị, na ị na-ezi ndị bi nʼetiti ndị mba ọzọ ka ha hapụ ịgbasokwa iwu , na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu maọbụ bie ndụ nʼusoro omenaala anyị. Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara nʼebe a. Ya bụ, jisie ike mee ihe anyị ga-agwa gị ugbu a. Anyị nwere mmadụ anọ nʼebe a, ndị nọ na nkwa ha kwere . Soro ha mee omenaala ahụ nke ndị nọ na nkwa ji edo onwe ha ọcha. Kwụọrọ ha ụgwọ maka ịkpụcha isi ha. I mee otu a, mmadụ niile ga-amata na eziokwu adịghị nʼihe ndị a niile e kwuru maka gị, kama na gị onwe gị na-agazi ma na-edebekwa iwu. Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.” Pọl kpọọrọ ndị ikom anọ ndị ahụ tinyere onwe ya, nʼụbọchị so ya mee ka ya na ha dị ọcha. Mgbe ahụ, ọ banyere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, maka ikwupụta ụbọchị ole mmemme ịdị ọcha ahụ ga-anọ tupu e mechaa ya, nakwa mgbe ịchụ aja nʼihi ha nʼotu nʼotu ga-abụ. Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị si ịa bịa hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ ma kpaliekwa ha. Ha jidere ya, na-eti mkpu, “Ndị ikom , nyerenụ anyị aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nʼebe niile na-ezi ozizi megidere ndị nke anyị, iwu anyị nakwa ebe a. Ma nke kachasị nke, ọ merụọkwala ụlọnsọ a site nʼịkpọbata ndị nʼime ya.” (Nʼihi na ha ebula ụzọ hụ ya na ọs onye ọs nʼime obodo, ha chere na Pọl kpọbatara ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ.) Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile. Mgbe ha na-achọ igbu ya, ozi ruru ọchịagha ntị na niile nọ nʼọgbaaghara. Otu mgbe ahụ o duuru ụfọdụ ndịisi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nʼebe ha nọ. Mgbe ha hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe. Ọchịagha ahụ bịara jide ya, nye iwu ka e were ụdọ igwe abụọ kee ya agbụ, ọ jụkwara onye ọ bụ na ihe o mere. Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu na-ekwu otu ihe, ebe ụfọdụ na-eti na-ekwu ihe ọzọ. Mgbe ọ na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na ọgbaaghara ahụ, o nyere iwu ka e duru ya gaa nʼogige ndị agha. Mgbe o rutere na mgbagolite ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, ndị agha bulitere ya elu nʼihi ọgbaaghara igwe ndị mmadụ dị ukwuu. Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu, “Wepụnụ ya! Wepụnụ ya!” Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nʼime ogige ahụ, ọ sịrị ọchịagha ahụ, “Ị ga-ekwe ka m gwa gị okwu?” Ọ sịrị, “I maara asụ asụsụ ndị ? Ọ pụtara na ị bụghị onye ahụ malitere ọgbaaghara ma duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nʼọzara?” Pọl sịrị, “Abụ m onye si ọs, obodo dị na , nwa afọ oke obodo amara aha ya. Biko, kwee ka m gwa ndị mmadụ okwu.” Mgbe o nyere ya ikike, Pọl guzooro nʼihe nrigo nke ọnụ ụzọ ahụ fee aka ya ime ka ha nọọ duu. Mgbe ha nọdụrụ nwayọọ, ọ gwara ha okwu nʼasụsụ sị,
Every verse in Acts 21
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.