Deuteronomy 26:12
“Nʼafọ nke atọ ọbụla, ị ga-enye onyinye pụrụ iche, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri, nke ihe ubi gị. Nʼafọ ahụ, ị ga-enye ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri gị, ka ha rie ya nʼobodo gị dị iche iche, ka afọ jukwa ha.”
Deuteronomy 26:12 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 12 of 19 in Deuteronomy chapter 26 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Deuteronomy 26 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe ị ga-aba nʼala ahụ anyị gị na-enye gị dịka ihe nketa, mgbe ị nwetara ya, birikwa nʼime ya, ị ga-ewere ụfọdụ nʼime mkpụrụ niile si nʼala ahụ anyị gị na-enye gị, tinye ya nʼime nkata, were ya gaa nʼebe ahụ anyị unu ga-ahọpụta, dịka ebe a kpọkwasịrị aha ya. Ị ga-agwakwa onye nchụaja nọ nʼọrụ nʼoge ahụ okwu sị: “Ana m ekwupụta taa nye anyị gị na abịala m nʼala ahụ anyị ṅụụrụ nna nna anyị ha nʼiyi inye anyị.” Onye nchụaja ahụ ga-anara nkata ahụ, dọba ya nʼihu ebe ịchụ aja anyị gị. Mgbe ahụ, ị ga-ekwupụta nʼihu anyị gị sị, “Nna nna m bụ onye na-awagharị awagharị, onye jere izere ndụ. Ha dị ole na ole mgbe ha gara , ma nʼ ha ghọrọ mba dị ukwuu, ndị dị ike, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ. Ma ndị mejọrọ anyị, mee ka anyị taa ahụhụ nʼihi ọrụ dị ike nke ha bokwasịrị anyị. Mgbe ahụ, anyị tikuru anyị nna nna anyị. Onyenwe anyị nụrụ olu anyị, hụkwa mmegbu a na-emegbu anyị, na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ, na ọnọdụ ọjọọ anyị. Onyenwe anyị ji aka dị ike na ogwe aka o setịrị eseti, nʼọtụtụ ihe oke egwu na ọrụ ịrịbama, na ihe ebube, si nʼ kpọpụta anyị. Ọ kpọbatara anyị nʼebe a, nye anyị ala a, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị, lee, ewebatala m mkpụrụ mbụ sitere nʼala i nyere m.” Dọba nkata ahụ nʼihu anyị gị, kpọọkwa isiala nye ya nʼebe ahụ. Mgbe ahụ, gị na ndị ị, na ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, ga-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọma niile anyị gị nyere gị na ezinaụlọ gị. Nʼafọ nke atọ ọbụla, ị ga-enye onyinye pụrụ iche, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri, nke ihe ubi gị. Nʼafọ ahụ, ị ga-enye ndị ị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri gị, ka ha rie ya nʼobodo gị dị iche iche, ka afọ jukwa ha. Ị ga-ekwupụta nʼihu anyị gị sị, “Esitela m nʼụlọ wepụ oke ahụ dị nsọ, nye ha ndị ị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, dịka i nyere m nʼiwu, enupughị m isi maọbụ chefuo iwu gị ọbụla. Erighị m ihe ọbụla si nʼime ya mgbe m na-eru ụjụ maọbụ wepụ ihe ọbụla nʼime ya nʼọnọdụ adịghị ọcha m, ọ dịkwaghị nke m ji chụọrọ ndị nwụrụ anwụ aja. Egeela m ntị nʼolu anyị m, meekwa ihe niile i nyere m nʼiwu. Site nʼebe obibi nsọ gị dị nʼeluigwe ledata anya gị, gọzie ndị gị na ala a i nyere anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, dịka i kwere nna nna anyị ha na nkwa.” Onyenwe anyị gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha. I kwupụtala taa na anyị bụ gị, i kweekwala nkwa na ị ga-ege ya ntị, debe iwu ya niile, na ụkpụrụ ya niile, na ị ga-emekwa ihe niile ọ sị gị mee. Taa kwa, Onyenwe anyị ekwupụtala na unu bụ ndị nke aka ya, dịka o kwere na nkwa, na ị ga-edebekwa ihe niile o nyere nʼiwu. O kwuru na ọ ga-emekwa ka i karịa mba niile o kere elu, nʼotuto, nʼaha, nsọpụrụ na ịja mma. Na unu ga-abụkwa mba dị nsọ nye anyị unu, dịka o kwere na nkwa.
Every verse in Deuteronomy 26
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.