Deuteronomy 27:25

““Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.””

Deuteronomy 27:25 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 25 of 26 in Deuteronomy chapter 27 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Deuteronomy 27 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mosis na ndị okenye nyere ndị iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa. Mgbe ị gabigara osimiri Jọ ruo nʼala ahụ anyị gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha. Depụta nʼelu nkume ndị ahụ iwu na ụkpụrụ ndị a mgbe ị batara nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, nke anyị nna nna gị kwere nkwa inye gị. Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọ, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu , dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha. Wuokwara anyị gị ebe ịchụ aja ya nʼebe ahụ. Ebe ịchụ aja eji naanị nkume wuo, nke ejighị ihe ngwa ọrụ igwe rụọ ihe bụla na ya. Jiri nkume a na-awaghị awa wuore anyị gị ebe ịchụ aja ahụ, chụọkwa aja nʼelu ya nye anyị gị. Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu anyị gị. Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.” Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị ị, gwakwara ndị niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị , gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke anyị unu. Nʼihi ya debe iwu niile anyị gị na ụkpụrụ niile ndị m nyere gị taa.” Nʼotu ụbọchị ahụ ka nyere ha iwu sị, Mgbe unu gafere Jọ, ebo ndị a: Simiọn, na ị na na na na , ga-eguzo nʼelu ugwu gọzie ụmụ Agbụrụ , , Asha, Zebụlọn, na ị ga-eguzo nʼelu ugwu kwupụta ọbụbụ ọnụ. Ndị ị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ niile, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya anyị, ma na-eguzobe ya na nzuzo.” Ndị mmadụ niile ga-aza sị, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.” “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-adịghị eme ka iwu ndị a guzosie ike site na-edebeghị ha.” Ụmụ niile ga-aza, “Amen.”

Every verse in Deuteronomy 27

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00