Ecclesiastes 1:10

“Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị, “Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”? Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga, nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị.”

Ecclesiastes 1:10 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 10 of 18 in Ecclesiastes chapter 1 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Ecclesiastes 1 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Okwu onye ozizi, nwa , onye bụ eze na . Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu ka onye ozizi na-ekwu. Ihe na-enweghị isi ka ihe niile bụ. Ihe niile bụ nnọọ ihe efu. Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ? Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa, ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi. Anyanwụ na-awa, na-adakwa, ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta. Ifufe na-efe gaa na ndịda; feekwa gburugburu gaa nʼugwu, ọ na-efegharị gburugburu ebe niile; na-efe na-enweghịkwa nsọtụ. Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri ma oke osimiri ejughị eju. Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a, malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri. Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ; ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ. Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị. Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị. Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ. Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ. Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị, “Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”? Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga, nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị. Anaghị echeta ndị mgbe ochie, otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa ndị ga-eso ha agakwaghị echeta ha. Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze nʼime . Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke bokwasịrị ụmụ mmadụ? Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe. Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie. Ihe na-ezughị ezu, enweghị ike ịgụta ha ọnụ. Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na . Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.” Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe. Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta, oke ihe ọmụma na-ewetakwa oke ihe mgbu.

Every verse in Ecclesiastes 1

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00