Ephesians 3:14
“Ọ bụ nʼihi nke a ka m na-egbu ikpere m nʼala nʼihu Nna anyị,”
Ephesians 3:14 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 14 of 21 in Ephesians chapter 3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Ephesians 3 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ọ bụ nʼihi nke a ka mụ onwe m bụ Pọl bụ onye mkpọrọ nke ọs ịst maka unu ndị mba ọzọ. Nʼihi nʼezie, unu anụla banyere nlekọta nke amara ahụ nke e nyere m maka ọdịmma unu. Otu e si kpughee nzube nzuzo ya niile nye m, dị ka m gwara unu ihe banyere ya nʼokwu dị nta nʼakwụkwọ ozi ahụ m detara unu. Ọ bụrụkwa na unu agụọ akwụkwọ ahụ m deere, unu ga-aghọta ihe m maara banyere ihe omimi ịst. Nke a e meghị ka ụmụ mmadụ mara nʼọgbọ gara aga dị ka Mmụọ Nsọ siri kpugheere ya ndị ozi na ndị amụma ya dị nsọ ugbu a. Otu a ka ndị mba ọzọ si soro bụrụ ndị nketa, ndị ga-abụ otu anụ ahụ na ndị ga-eketa nkwa ahụ nʼime ọs ịst site nʼoziọma. E mere m ka m bụrụ onyeozi nke oziọma a, dịka onyinye amara nke si dị, bụ nke e nyere m site nʼịrụ ọrụ nke ike ya. Ọ bụ ezie na mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nʼetiti ndị nsọ niile, e nyere m amara nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ nke enweghị atụ nke juru nʼime ịst, meekwa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmatụ nke ihe omimi e zoro nʼime onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ. Ka ọ ga-abụ site na chọọchị, a ga-eme ka amamihe nʼụdị dị iche iche bụrụ ihe ọchịchị na ikike niile dị nʼeluigwe ga-amata. Nke a bụ nʼusoro nke atụmatụ ya dị ebighị ebi, nke e mezuru nʼime ọs ịst anyị, bụ onye anyị nwere ntụkwasị obi na obi siri ike ịbịakwute site nʼokwukwe anyị nwere na ya. Nʼihi nke a, arịọ m ka unu ghara ịda mba maka mkpagbu m nʼihi unu, ha bụ otuto nye unu. Ọ bụ nʼihi nke a ka m na-egbu ikpere m nʼala nʼihu anyị, onye ezinaụlọ niile dị nʼụwa a na nke dị nʼeluigwe na-esite nʼaka ya enwe aha. Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu; ka ịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya. Ana m arịọkwa, ka unu na ndị nsọ niile nwee ike ịghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi, na ịmatakwa ịhụnanya nke ịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke . Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ imebiga ihe nʼoke karịa ihe niile nke anyị rịọrọ, maọbụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nʼuche anyị, site nʼike ya nke na-arụ ọrụ nʼime anyị, ọ bụ ya ka otuto dịrị nʼime chọọchị na nʼime ịst ọs ruo ọgbọ niile nke mgbe niile, ebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen.
Every verse in Ephesians 3
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.