“Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya.”
Esther 1:6 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 6 of 22 in Esther chapter 1 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Esther 1 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze , bụ nke chiri alaeze nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa (127), nke gbasakwara site nʼ rụọ .Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze bụ ebe ocheeze ya dịkwa.Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o mere mmemme oke oriri nye ndịisi ọrụ ya niile. Ndị ọzọ ọ kpọkwara bụ ndịisi agha nke ịa na , na ụmụ eze, na ndị ọchịchị sitere na mba dị iche iche ọ na-achị.Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ (180). Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya.Mgbe ụbọchị ndị a gafesịrị, eze kpọrọ oke oriri nọrọ ụbọchị asaa nʼubi a gbara ogige dị nʼụlọeze, nye ndị niile nọ na , site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta.Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya.E jikwa iko ọlaedo ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Iko ọlaedo ọbụla e wepụtara nʼụbọchị ahụ dị iche nʼiche. O nweghị nke yiri ibe ya. E mekwara ka mmanya eze baa ụba dịka afọ ọma aka eze si dị.E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ.Nʼotu oge ahụ, eze nwanyị , kpọkwara oke oriri nye ụmụ nwanyị niile nọ nʼụlọeze, Sekses.Nʼụbọchị nke asaa, mgbe obi dị eze mma nʼihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ nyere ndị onozi asaa ndị a na-ejere ya ozi iwu, ha bụ, Mehuman, na , na , na , na , na , na ,sị ha gaa kpọọ nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na mara mma.Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu.Dịka eze na-eme, ọ kpọkwara ndị ọkachamara nʼihe gbasara iwu na ikpe ziri ezi. Eze na ndị a mara ihe, bụ ndị maara ihe ụbọchị nyere kparịtara ụka.Ha bụkwa ndị na-anọkarị eze nso. Aha ha bụ , na , na , na , na , na , na . A maara aha mmadụ asaa ndị a nʼala na ịa. Ha bụ ndị na-aga nʼihu eze mgbe ọbụla ha chọrọ, bụrụkwa ndị dịkarịsịrị elu nʼalaeze ahụ.Eze jụrụ sị, “Dịka iwu si dị, gịnị ka a ga-eme bụ nwunye eze nʼihi na o nupuru isi nʼiwu eze nyere nke o zigaara ya site nʼọnụ ndị onozi ya?”Memukan kwuchitere ọnụ ndị ọzọ sị, “Ihe nwunye eze mere jọrọ njọ. O mehiela eze, mehiekwa ndị ọchịchị niile, na ndị niile bi nʼakụkụ niile nke alaeze .Nʼihi na ndị inyom niile ga-amata ihe eze nwanyị mere, malite ilelị ndị di ha anya, ma na-ekwu sị, ‘Eze nyere nwunye ya iwu ka ọ bịa nʼihu ya, ma ọ jụrụ ịbịa.’Nʼụbọchị taa ka ndị inyom ndịisi nke ịa na , bụ ndị nụrụ banyere omume nwunye eze mere, ga-azakwa ndịisi ọchịchị alaeze gị nʼụzọ dị otu a. A ga-enwe nleda anya na esemokwu nʼala a mgbe niile.“Ya mere, ọ bụrụ na ọ masị eze, ya nye iwu, nke a ga-edepụta, ka ọ bụrụ iwu nʼala ịa na , nke na-agaghị agbanwe, na agaghị abatakwa nʼihu eze ọzọ. Ka eze werekwa ọnọdụ eze nwanyị ahụ nye onye ọzọ ka ya mma.Ọ ga-erukwa na mgbe a gụpụtara iwu a eze nyere nʼakụkụ alaeze a niile, ndị inyom niile ga-asọpụrụ ndị di ha site nʼonye dịkarịsịrị nta nʼetiti ha ruo nʼonye dị ukwuu.”Eze na ndịisi ọchịchị ya nabatara ndụmọdụ a, nʼihi ya, eze mere ihe kwuru.O zipụrụ akwụkwọ ozi a nye akụkụ niile a na-achị achị nke alaeze ahụ. E dekwara akwụkwọ ozi ahụ nʼasụsụ dị iche iche, na-ekwupụta nʼasụsụ ọbụla na nwoke ọbụla kwesiri ịbụ onye na-achị ezinaụlọ ya.