Esther
Esther 8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Esther 8 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼotu ụbọchị ahụ, Ahasuerọs bụ eze, nyefere nwunye eze akụnụba niile onye iro ndị nwere. E mekwara ka Mọdekai bịa nʼihu eze, nʼihi na agwala eze na ọ bụ nwanne nna ya. Mgbe ahụ, eze wepụtara ọlaaka ikike ya, nke a gbapụtara site nʼaka nye ya Mọdekai. Esta mekwara Mọdekai onye nlekọta akụnụba . Ọzọkwa, Esta bịara nʼihu eze daa nʼala nʼụkwụ eze rịọ ya arịrịọ nʼanya mmiri ka ọ kwụsị echiche ọjọọ ahụ onye , chere megide ndị . Eze setịpụrụ mkpara ọlaedo ya nye . Esta biliri, guzo nʼihu eze, ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na m hụtara amara nʼihu ya, bụrụkwa ihe ziri ezi nʼanya eze, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ka ede iwu nʼakwụkwọ ịkagbu ozi nwa , onye , nke o chepụtara dee ime ka a laa ndị nʼiyi nʼala niile eze na-achị. Nʼihi na m ga-esi aṅaa nagide ya, ịhụ ka a na-egbu ndị m, na-alakwa ụmụnna m nʼiyi?” Mgbe ahụ, eze bụ ọs gwara nwunye eze na Mọdekai onye okwu sị ha, “Enyela m akụnụba , ha akwụgbukwaala nʼosisi, nʼihi na ọ chọrọ ịla ndị nʼiyi. Ugbu a, deenụ akwụkwọ ozi banyere ndị niile, dee ihe ọbụla dị mma nʼanya unu nʼaha eze. Werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, nʼihi na ọ dịghị akwụkwọ ọbụla e dere nʼaha eze, kaakwa ya akara mgbaaka eze nke a pụrụ imegharị.” Otu mgbe ahụ, akpọrọ ndị ode akwụkwọ eze. Ọ bụ nʼiri abalị na atọ nke ọnwa atọ nʼafọ nke bụ ọnwa ka ihe ndị a mere. Ha dere iwu niile Mọdekai nyere banyere ndị , ndịisi ọchịchị niile na ndị ọchịchị niile na-elekọta mpaghara alaeze niile site nʼ ruo . Ọnụọgụgụ ha niile dị otu narị na iri abụọ na asaa (127). E depụtasịrị iwu ahụ nʼodide akwụkwọ nke ala ọbụla a na-achị achị si dị, na dịka asụsụ ndị ọbụla si dị, ma nyekwa ndị dịka odide akwụkwọ na asụsụ ha si dị. Mọdekai dere akwụkwọ ahụ nʼaha eze, bụ ọs, werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, zipụ akwụkwọ ndị a site nʼaka ndị ọgba ọsọ ndị ịnyịnya na-ebu, bụ ndị na-agba ịnyịnya ụkwụ ọsọ nke e leziri anya nke ọma zụọ maka ije ozi dịrị eze. Akwụkwọ nke iwu eze a, nyere ndị niile nọ nʼobodo ọbụla ike izukọta nʼotu maka ịzọ ndụ ha, nyekwa ha ikike ibibi, gbuo ma laa nʼiyi ndị agha nke mba ọbụla, maọbụ ala ndị ahụ a na-achị achị bụ ndị nwere ike ịla ha, ndị inyom ha na ụmụntakịrị ha nʼiyi, na ịpụnara ha akụnụba ha. Ụbọchị a akara aka maka ndị ime ihe ndị a nʼobodo niile nʼalaeze eze ọs bụ nʼabalị iri na atọ nke ọnwa . E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha. Ndị ahụ na-agba ọsọ, bụ ndị na-ebu akwụkwọ ozi, nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya eze mee ngwangwa pụọ, ebe iwu eze kwaliri ha. E nyekwara iwu a na . Mgbe Mọdekai si nʼihu eze pụọ, o yi uwe ndị eze nke na-acha ọcha, na nke na-achakwa anụnụ anụnụ, kpurukwa okpueze ọlaedo dị ukwuu, na uwe mwụda e ji ezi akwa nke na-acha odo odo dụọ nʼahụ ya. Obodo tiri mkpu ṅụrịakwa ọṅụ. Nye ndị nʼonwe ha, ọ bụ oge ịṅụrị ọnụ, obi ụtọ na nsọpụrụ. Na mpaghara alaeze ahụ niile, na nʼobodo ọbụla nke iwu eze ahụ bịaruru, e nwere ọṅụ na obi ụtọ nʼetiti ndị niile, nweekwa oke oriri na ọṅụṅụ. Ọtụtụ mmadụ nʼime ndị si mba dị iche iche ghọrọ ndị , nʼihi egwu ndị dakwasịrị ha.
Every verse in Esther 8
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.