Esther

Esther 9

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Esther 9 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa , bụ ụbọchị a gaara emezu iwu ahụ eze nyere. Nʼụbọchị a, ndị iro ndị lere anya na ha ga-ekpochapụ ha. Ma ugbu a, a tụgharịala iwu ahụ, mee ya ka ọ bụrụ ihe megidere ndị ahụ kpọrọ ndị asị. Ndị chịkọtara onwe ha ọnụ nʼobodo niile dị nʼalaeze eze , maka ịzọ ndụ ha. Ma o nweghị onye ọbụla pụrụ imegide ha, nʼihi na egwu ha dakwasịrị ndị obodo niile dị iche iche. Ndịisi ọchịchị obodo niile, ndị na-anọchite anya eze, na ndịisi, na ndị ozi eze, nyeere ndị aka, nʼihi na ha tụrụ egwu Mọdekai. Nʼihi na Mọdekai bụ onye a ma ama nʼụlọeze, ọ bụkwa onye a maara aha ya nʼalaeze ahụ niile, nʼihi na ike ọchịchị ya na-abawanye ụba karịa ụbọchị niile. Nke a mere, na ndị ji mma agha gbuo, ma bibie ndị iro ha niile. Ha mesoro ndị kpọrọ ha asị mmeso ọbụla masịrị ha. Nʼime obodo ahụ e wusiri ike bụ , ndị gburu narị ndị ikom ise laa ha nʼiyi. Ha gbukwara , Dalfon, Aspata, Porata, Adalia, Aridata, Pamashta, Arisai na , ha bụkwa ụmụ ndị ikom iri nwa , onye iro ndị mụtara. Ma ha emetụghị akụnụba ha aka. Nʼụbọchị ahụ, a gwara eze ọnụọgụgụ ndị e gburu nʼobodo . Eze sịrị bụ nwunye eze, “Ndị egbuola narị mmadụ ise nʼobodo , gbukwaa ụmụ ndị ikom iri. Ebe ha mere otu a nʼebe a, onye ma ihe ha mere nʼobodo dị iche iche nʼalaeze m? Ugbu a, gịnị ọzọ bụ arịrịọ gị? A ga-emezuru gị ya. Gịnị ọzọ bụ ihe ị chọrọ? A ga-emekwa ya.” Esta sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka ndị bi na meekwa ihe ha mere taa echi, ka a kwụbakwa ụmụ ndị ikom iri nʼelu osisi.” Ya mere, eze kwenyere, a kụkwara ya dịka ekwe na , a kwụbara ụmụ iri nʼelu osisi. Ndị bi na chịkọtakwara onwe ha ọnụ nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa , gbuo narị mmadụ atọ ọzọ nʼobodo . Ma ha emetụghị akụnụba ndị ahụ aka. Ma ndị ndị ọzọ bi nʼobodo ndị ọzọ dị iche iche eze na-achị, jikọtakwara onwe ha ọnụ ịzọ ndụ ha, site otu a nwere onwe ha pụọ nʼaka ndị iro ha. Ha gburu iri puku mmadụ asaa na ise bụ ndị kpọrọ ha asị, ma ha emetụghị akụnụba ha aka. E mere ihe ndị a nʼabalị iri na atọ nke ọnwa , ha zukwara ike nʼụbọchị so ya bụ abalị iri na anọ. Ha mere ụbọchị ahụ, ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ. Ma ndị nọ na zukọtara nʼụbọchị nke iri na atọ, na nʼụbọchị nke iri na anọ. Emesịa, nʼụbọchị nke iri na ise ha zuru ike, mekwa ya ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ. Ọ bụ nke a mere ndị niile bi nʼime ime obodo ji eme mmemme ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ nʼabalị iri na anọ nke ọnwa iri na abụọ nke afọ ọbụla. Ha mere ụbọchị ahụ ka ọ bụrụkwa ụbọchị inyerịta onyinye. Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze , ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya, ka ha na-eme mmemme a kwa afọ nʼụbọchị nke iri na anọ na nke iri na ise nke ọnwa ọbụla. Nke a bụ iji gosi mgbe ndị nweere onwe ha site nʼaka ndị iro ha, na iji cheta mgbe iru ụjụ ha ghọrọ ọṅụ, na mgbe ịkwa akwa ha ghọrọ ụbọchị mmemme ọṅụ. O deere ha ka ha debe ụbọchị ndị a dịka ụbọchị mmemme ọṅụ na oriri na ọṅụṅụ, na inyerịta onwe ha onyinye ihe oriri na inye ụmụ ogbenye onyinye dị iche iche. Ya mere, ndị kwenyere ịga nʼihu ime mmemme a nke ha malitere ime, dịka Mọdekai si deere ha ya, nʼihi na nwa , onye , onye iro ndị niile, kpebiri ịla ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ ọ tụpụtara site nʼife nza. Mgbe izu ọjọọ a ruru eze ntị, o nyere iwu nke e debanyere nʼakwụkwọ sị, ka echiche ọjọọ nke megide ndị tụgharịa nʼisi ya, ọ kwukwara ka akwụgbuo ya na ụmụ ndị ikom niile nʼelu osisi. Ya mere, a kpọrọ ụbọchị ndị ahụ nke sitere na mkpụrụ okwu . Nʼihi ihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ na nke ha hụkwara na nke mekwaara ha. Ndị niile kwekọrịtara idebe mmemme a, na imekwa ka ụmụ ha, na ndị niile kwenyere iso ha, na-emekwa ya. Ha kpebiri na ha ga-edebe ụbọchị abụọ ndị ahụ kwa afọ, nʼụzọ nakwa oge e zubere ka ọ bụrụ. Aga na-echeta ụbọchị ndị a, na-eme kwa ya nʼọgbọ niile ọbụla, nʼezinaụlọ ọbụla, nʼala ọbụla a na-achị nakwa obodo ọbụla. Ndị aghaghị idebe mmemme ụbọchị , ma ọ bụkwanụ ncheta ụbọchị ndị a apụọ nʼobi ọgbọ ha niile. Nʼoge a, Esta nwunye eze, nwa , na Mọdekai onye jikọtara aka dee akwụkwọ ọzọ nke e ji mesie akwụkwọ ahụ Mọdekai dere ike, maka ịmalite mmemme . Mọdekai zipụrụ akwụkwọ ozi nke okwu udo na eziokwu dị nʼime ya, nye ndị niile bi nʼime mpaghara alaeze , nke dị otu narị na iri abụọ na asaa (127). E ji akwụkwọ a mesie okwu ahụ ike na a ga-edebe ụbọchị ndị ahụ kwa afọ maka mmemme dịka Mọdekai onye na nwunye eze nyere nʼiwu. Ndị niile na ụmụ ụmụ ha ga-eme mmemme a nʼoge a kara aka, dịka ha si edebe iwu ndị ọzọ metụtara oge ibu ọnụ na oge iru ụjụ. Iwu a nyere mesịrị ụkpụrụ mmemme ike. E dekwara ya nʼakwụkwọ.

Every verse in Esther 9

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00