Exodus 19:4

“‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo, si otu a, dọtara unu onwe m.”

Exodus 19:4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 4 of 25 in Exodus chapter 19 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 thread runs through this chapter

Exodus 19 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼọnwa nke atọ, site nʼoge ndị hapụchara obodo , nʼụbọchị ahụ, ha bịaruru ọzara Saịnaị. Ọ bụ site na ka ha sị bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha nʼebe ahụ, nʼakụkụ ugwu Saịnaị. Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute . Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ ọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ : ‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị , hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo, si otu a, dọtara unu onwe m. Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m, ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ ndị a ka ị ga-agwa ụmụ .” Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị , gwa ha okwu niile nke anyị nyere ya nʼiwu. Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla anyị kwuru ka anyị ga-eme.” gwara anyị ihe niile ndị kwuru. Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” gwara ndị niile okwu nke anyị gwara ya. Onyenwe anyị gwara okwu ọzọ sị, “Rịdakwuru ndị m, doo ha nsọ taa na echi. Nʼihi na nke a ga-abụ nkwado ha izute m. Ka ha saa uwe ha mmiri, jikerekwa nʼụbọchị nke atọ. Nʼihi na m ga-arịdata nʼelu ugwu Saịnaị nʼihu mmadụ niile. Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’ Agaghị emetụ onye mmebi iwu ahụ aka, kama, a ga-eji nkume tugbuo ya, maọbụ e were àkụ gbagbuo ya, maọbụ mmadụ maọbụ anụmanụ, ọ gaghị adị ndụ. Mmadụ ọbụla agaghị abịaru ugwu ahụ nso, ruo mgbe ha nụrụ opi nke a ga-afụ. Mgbe ahụ, ha nwere ike bịa nso ugwu ahụ.” Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ . O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha. Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.” Mgbe o ruru nʼụtụtụ ụbọchị nke atọ ahụ, oke igwe ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Amụma malitere na-egbuke, egbe eluigwe malitekwara ịgba. Nʼikpeazụ, opi ike dara. Mmadụ niile tụrụ egwu, makwa jijiji. Mosis duuru ndị mmadụ ahụ niile si nʼụlọ ikwu ha pụta gaa izute . Ha niile guzokwara nʼala ugwu ahụ. Mgbe ahụ, anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị. Ma lee! Onyenwe anyị rịdatara dịka ire ọkụ nʼelu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rigoro elu dịka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ. Ala ọma jijiji dị ukwuu dakwasịkwara ugwu ahụ. Mgbe opi ike ahụ na-ada ike ike, Mosis malitere ịgwa okwu. Chineke zaghachiri okwu site nʼolu dara ụda dịka egbe eluigwe. Onyenwe anyị rịdatara bịaruo nʼelu ugwu Saịnaị. Ọ gwara ka ọ rịgota bịa zute ya. Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ ijekwuru . Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Rịda gaa dọọ ndị mmadụ ahụ aka na ntị ka ha ghara ịgafe oke ala ahụ bịaruo nso ịhụ anyị anya ka ha ghara ịla nʼiyi. Ọ bụladị ndị nchụaja ndị chọrọ ịbịaru anyị nso aghaghị ido onwe ha nsọ. Ma ọ bụghị otu a, Onyenwe anyị ga-eme ka ha niile nwụọ.” Mosis zaghachiri anyị sị, “Ndị mmadụ agaghị arịgota nʼugwu Saịnaị nʼihi na gị onwe gị adọọla anyị aka na ntị sị, ‘Kpaanụ oke gburugburu ugwu a, doo ya nsọ.’ ” Ma anyị gwara okwu sị: “Gbada gaa kpọgota Erọn ka gị na ya soro rigota nʼelu ugwu a. Ma lezie anya ka ndị nchụaja na ndị ghara irigota nʼebe a ịbịakwute anyị, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-eji ike laa ha nʼiyi.” Ya mere, Mosis rịdakwuru ndị ga gwa ha.

Every verse in Exodus 19

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00